Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,156,161 members, 7,829,145 topics. Date: Wednesday, 15 May 2024 at 08:21 PM

Agụmagụ Igbo Dịka Ngwaọrụ N’ịkwalite Ezi Nchekwa Na Nkwụsiike Ọhaobodo - Culture - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / Agụmagụ Igbo Dịka Ngwaọrụ N’ịkwalite Ezi Nchekwa Na Nkwụsiike Ọhaobodo (4677 Views)

Oke Ọñụ, Dịka Ndi Ebenatọ Họpụtara Ndị Ndu Ọhụụ. By Izunna Okafor / Nwulite Asụsụ Na Omenala Igbo / Kedu Ihe Na Eme Ndi Igbo Na Nairaland? (2) (3) (4)

(1) (Reply)

Agụmagụ Igbo Dịka Ngwaọrụ N’ịkwalite Ezi Nchekwa Na Nkwụsiike Ọhaobodo by scholti: 12:28pm On Dec 07, 2015
Agụmagụ Igbo dịka Ngwaọrụ n’ịkwalite Ezi Nchekwa na
Nkwụsiike Ọhaobodo
Nkoli Mercy Nnyigide
http://www.ajol.info/index.php/ujah/article/viewFile/113333/103050

Ụmị Edemede
Ka Naịjirịa nwerechara onwe ya n’afọ 1960, olileanya ọtụtụ
ụmụamala ya bụ na ihe ga-adịzị mma. Mana ka oge na-aga, a
chọpụtara na ihe na-akawanye njọ. Usoro ọchịchị dị iche iche
dapụtara. Ndị amị na ndị nkịtị achịala mana ọnọdụ gara
n’ihu na-akawanye njọ. O bu ihe doro anya na ọchịchị ha bụ
nke nchịgbu na fọnfọju akpa. N’agbanyeghị na Chineke ji
akụnaụba na ngozi dị iche wee chọọ Naịjirịa mma, agụụ ka
na-afịọ ụmụ ya ọnụ; iheegwu na oke ụjọ na-eme oge niile;
ọtụtụ nne na nna anaghị akwụnwuziri ụmụ ha ụgwọ akwụkwọ;
ndị ntorobịa gara mahadum enweghịkwa ọrụ. Ajọ ọnọdụ dị
etu a na-ebute ọgbaaghara n’obodo ma na-etinyekwa ọtụtụ
ụmụ Naịjirịa na mpụ dị iche iche dịka izu ohi, ịtọrọ mmadụ,
igbufu mmadụ, ịkwafu ọbara mmadụ dịka mmiri, dgz. Ọ bụ
ihe ndị a kpalitere mmụọ omenchọcha ịchọpụta ụzọ dị iche
iche agụmagụ Igbo, ọ kachasị abụ ederede Igbo ga-esi nye
aka n’ibelata ajọ ọnọdụ a ma weta udo na ezi nchekwa ma
kwalitekwa nkwusiike nke ohaobodo. N’ime nke a, a tụlere
abụ ederede Igbo dị iche iche iji chọpụta echiche ndị odeeabụ
Igbo gbasara ọnọdụ ọchịchị obodo Naịjirịa nakwa aro na ụzọ
dị iche iche ha tụpụtara a ga-esi wee belata ajọ ọnọdụ a, ka e
wee nwee ike kwalite ezi nchekwa na ọganiihu obodo Naịjirịa.
Agumagu Igbo dika Ngwaoru n'ikwalite ezi Nchekwa na Nkwusiike Ohaobo

Abstract
After the Nigerian independence in 1960, the expectation of
many of her citizens was that things would be better. But as
time went on, it was observed that things were becoming
worse. Different systems of government emerged. The military
and civilians ruled but situation went forth to be bad. It was
obvious that their governance was bad and characterized with
selfish interest. Notwithstanding that God blessed Nigeria
with many resources; her citizens are still suffering from
hunger; terrible things always happen; many parents could no
longer afford their childrens’ school fees; youths that
graduated from the university are unemployed. This kind of
unhealthy situation brings about social instability and
encourages some Nigerian to engage in different crimes like
robbery, kidnapping, extra judicial killings, and murder of
different kinds, etc. it is against this background that the
researcher hopes to examine different ways the Igbo
literature, especially the Igbo written poetry could help to
control this ugly situation and bring about good security and
also promote social stability. The study analyzed some written
Igbo poems in order to observe the position of some Igbo
poets concerning the situation of governance in Nigeria and
their contributions on how to improve it, so as to promote
good security and progress in Nigeria.

Mkpọlite
Agụmagu nwere nghọta abuọ. Uzoma Nwadike kọwara na
nghọta nke mbụ, bụkwa nghọta izugbe, bụ na agụmagụ bụ ihe
ọ bụla dị n’ụdị edereede. N’ihi nke a, ihe amụmamụ ọ bụla
dịka sọm, akụkọala, dgz, nwere agụmagụ nke ya. Nghọta nke
abụọ agụmagụ nwere pụrụ iche bụ nke kọwara ya dịka ọrụ
nka nke e sitere na ya wee na-akowapụta ma na-ahụ ndụ. (80).
N’ịga n’ihu, agụmagụ dịka ihe ọmụmụ bụ ọrụ nka nke e
chepụtara echepụta, ma jiri asụsụ nka chọọ ya mma, nke e si
UJAH: Unizik Journal of Arts and Humanities
176
na ya egosipụta ma na-ahu ndu. O nwere ike ịdị n’ụdị
ekwurunọnụ maọbụ ederede. Agụmagụ nwere nnukwu
ngalaba atọ ndị a: akụkọ, ejije na abụ.
Agụmagu Igbo malitere n’oge gboo mgbe ndị Igbo
malitere ndụ ha. Ụdị agụmagụ e nwere n’oge ahụ bụ nke
ọdịnala. E deghị ụdị agụmagụ a ede; ọ bụ naanị ọnụ ka e ji
agụpụta ya. Ọ na-esi n’aka ndị nna nna wee fere n’aka ụmụ
ụmụ ha. Ka oge na-aga, mgbe ndị ọcha bịara n’ala Igbo, ha
wepụtara igwe e ji ebiputa akwụkwọ. Ọ bụ oge ahụ ka ndị
odee maliteziri depụtawa ma bipụtawakwa ụfọdu akwụkwọ
agụmagụ ederede.
Agbụrụ maọbụ obodo dị iche iche nwere ụzọ dị iche
iche ha si akatọ ọchịchị nchịgbu ma na-ebuso akparamagwa
ọjọọ dị iche iche agha. Ụfọdụ obodo kwenyere n’iji egbe na
mma wee chụọ mpụ na arụrụala na-aga n’ọha obodo ọsọ.
Mana ndị odee, ndị na-eti egwu, ndị na-emepụta ejije, dgz. naesite
n’ọrụ nka ha were akatọ akparamagwa ọjọọ dị iche iche
na-aga n’ọha obodo. Ha na-esite n’ọrụ nka ha wee na-arụtụ
aka n’ihe dị iche iche na-eme na gburu- gburu ha dịka:
ndọrọndọrọ ọchịchị, agụmakwụkwọ, ahụike, nchekwa, ọnọdụ
akụnaụba, dgz. Mbọ ha na-agba bụ ka e site n’ọrụ nka ha wee
kwalite udo, nchekwa, nkwusiike na ọganiihu obodo.
Nchekwa pụtara ilekọta akụnaụba maọbụ ndụ anya
nke ọma, n’ekweghị ka mkpagbu ọbụla bịakwasị ya. E lee
anya ka ihe si kwụrụ n’obodo Naịjirịa taa, a ga-achọpụta na e
nweghị ezi nchekwa na ya. Mpụ, arụrụala na akparamaagwa
ọjọọ dị iche iche ndị isi ọchịchị na ndị a na-achị achị naakpa
ekweghị na ala ga-adị mma. Ịmaatụ, site n’ihe dịka n’afọ
2002, ndị otu a na-akpọ Boko Haram malitere ibute nnukwu
ọgbaaghara n’ala Naịjirịa. Ha na-akwafuzi ọbara ụmụ mmadụ
ka mmiri. Ọzọ, n’afọ 2012, e gbusịrị ụfọdụ ụmụ okorobịa
Naịjirịa na-agụ akwụkwọ na Mahadum Port Harcourt n’ụzọ
ezighị ezi. Ọnọdụ ndị a bụ ihe ịgba anya mmiri nye ụmụ
Agumagu Igbo dika Ngwaoru n'ikwalite ezi Nchekwa na Nkwusiike Ohaobodo
177
Naịjirịa Ihe ndị a niile na-egosi na e nweghị ezi nchekwa n’ala
Naịjirịa taa.
Na ngalaba atọ agụmagụ nwere: iduuazị, ejije na abụ,
edemede a ga-agbado ụkwụ n’abụ ederede Igbo. N’edemede
a, a họọrọ ma tulee abụ ederede Igbo anọ iji gosipụta echiche,
ozi na aro ndị odee ha na-atunye gbasaara ka ihe si kwụrụ
n’ala Naịjirịa taa; ọ kachasị etu o si metụta ịkwalite nchekwa
na ọganiihu obodo. Abụ ndị a họọrọ gụnyere: “Ụkọ n’uju” na
“Arịrịọ” n’Ụtara Ntị nke ‘Nolue Emenanjo (n.d), “Naịjịrịa bụ
enyi mba” n’ Uche bụ Afa nke Goddy Onyekaonwu bigharịrị
n’afọ 2003, na “Naịjịrịa” n’Ije Ụwa nke Nkechinyere
Okediadi bipụtara n’afọ 2003.
Ihe kpatara e ji wee gbado ụkwụ n’abụ bụ na abụ bụ
ngalaba agụmagụ kacha enye ndị odee ohere pụrụ ịche
n’izipụta echiche na mmetụtaobi ha gbasara ka ihe si kwụrụ
n’obodo. N’ịkwado nke a, Emmanuel Jenkwe kọwara na abụ
bụ ngalaba agụmagụ bakarịrị uru n’ịkatọ maọbụ ịkwatu ndị
ọchịchị nchigbu (165).
Nnyocha Agụmagụ
N’ebe a, ọ dị mkpa ka e nyetụ nkọwa gbasara abụ. Ọtụtụ ndị
ọkammụta n’ihe ọmụmụ agụmagụ enyela nkọwa dị iche iche
gbasara abụ. Na nkọwa nke ya, C. Ekwealor kọwara abụ dịka
ngalaba agụmagụ na-ejikarị enyookwu (nhụrụnuuche) na
ndanusoro arụ ọrụ. Ọ gara n’ihu kọwaa na ihe na-emebe abụ
bụ nkaasụsụ e jiri dee ya (26). Nkọwa a dabara adaba n’ihi na
a bịa n’abụ, ndị odee na-ahọrọ okwu n’ụzọ ọ ga-esi wee naemetụta
ọgụụ na mmụọ mgbe ọ na-agụ ya. Nke a na-egosi na
nkaasụsụ a na-ewebata n’abụ na-adị iche n’ụdị nkaasụsụ e ji
ezipụta ngalaba agụmagụ ndị ọzọ.
N’echiche nke ya, Nwadike kọwara na abụ bụ ọrụnka
nke e tinyere n’asụsụ dị ọgọ, hazie n’usoro pụrụ iche, bịa
nwee echiche miri emi na mmetụta n’ahụ na n’obi (72).
Nkọwa a na-egosikwa na nkaasụsụ e ji ede abụ na-apụ iche.
UJAH: Unizik Journal of Arts and Humanities
178
Ihe ọzọ gbara elu na nkọwa a bụ na a na-ede abụ n’ụzọ o si
emetụta na mmụọ. Ihe ndị a dị iche na ngalaba agụmagụ ndị
ọzọ.
Nchọpụta na-egosi na e nwere ihe ndị mebere abụ
Igbo. Ihe ndị ahụ dịka Asoonye Ụba- Mgbemena si rụtụ ha
aka bụ: echiche, asụsụ, ndanusoro na mmetutaobi (vii). Ọ bụ
ihe anọ a a kpọrọ aha n’elu jikọrọ ọnụ mebe abụ Igbo. Ya bụ,
na abụ agaghị ezu oke ma ọ bụrụ na ihe anọ a adịghị na ya.
N’edemede abụ, ndị odee na-ejikarị ikpe akwara ngwaọrụ.
Gịnị bụ ikpe? N’echiche ya, Nwadike kọwara na ikpe bụ;
Nkọrọmọọnụ nke e sitere n’ụzọ egwu na amụ,
ekwuechezọ, akaje, emu, mkparị na oyiri ha ndị
ọzọ wee na-akatọ mọọbụ na-agba n’anwụ, ajọ ihe
na ajọ omume na nzuzu. Ikpe anaghị eji mba, ọgụ
na mgba, okwu na ụka mọọbụ esemokwu aga.
Mgbe ụfọdụ a na-apụta ihe, kwuo hooha ihe a
chọrọ ikwu, ma mgbe ụfọdụ kwa, a ‘na-ekpu ekete
n’isi gwa eze’ ihe a chọrọ ịgwa ya (106) .
Ikpe bara nnukwu uru. Dịka Nwadike si kowaa,
Ikpe na-arụ orụ dịka ihe e ji agbazi omume
gbagọrọ agbagọ ndị mmadụ na-eme. E ji ikpe eme
ka ọhanaeze guzosie ike n’akparamagwa ha maka
na onye mewechaa ka ọ sọrọ ya, obodo eree ka
ogiri. Ya bụ, na ihe ndị na-akpọlite ikpe
n’ọhaobodo bụ ajọ akparamagwa ndị mmadụ na
usoro ihe ụfọdụ na-adabachaghị adaba. Mgbe
ọbụla okpeikpe kpere ikpe, ọ na-ajalite ọhanaaeze
ka ha soro katọọ ihe ọjọọ. Ọ na-eme ka onye
mọọbu otu na-eme ajọ ihe mịkpulaa ka ọhaobodo
nwee ezumike nke obi (107).
Ọ bụ uru ndị a ikpe bara mere na e nwere ụdị abụ Igbo a naakpọ
abụ ikpe. Ọ bụ ụdị abụ a ka ndị odeabụ na-ejikarị agba
Agumagu Igbo dika Ngwaoru n'ikwalite ezi Nchekwa na Nkwusiike Ohaobodo
179
ọtụtụ ihe na-eme n’obodo n’anwụ. Ha na-esitekwa na ya were
akatọ akparamagwaa ọjọọ dị iche iche ndị mmadụ, gọọmenti,
ndị isi ọchịchị, dgz. na-akpa. Ekwealor kọwara abụ ikpe dịka
ụdị abụ e ji akatọ ihe ọjọọ dị iche na ndụ mmadụ maọbụ
n’etiti ọhanaeze. Ọrụ abụ ndị a na-abụkarị ịhazi ndụ ụmụ
mmadu site n’ịgba agwa ọjọọ n’anwụ (29). N’echiche nke ya,
Nwadike kọwara na, a na-eji abụ ikpe akọtọ ajọ ihe dịka
omume ọjọọ: nrafu, aghụghọ, arụrụala, nzuzu, ịgba asịrị, na
ihe ndị ọzọ na-adịghị mma ụmụ mmadu na-eme. Oge ụfọdụ, a
na-esite n’otito katọọ ihe ọjọọ mmadụ na-eme n’emeghị ka
onye ahụ mata kpọmkwem na a na-akọcha ya. Ọtụtụ oge, ndị
egwu na-esite n’egwu ha katọọ ihe ọjọọ na-aga n’obodo (53).
Abụ ndị a tulere n’edemede a dabachara n’abụ ikpe.
Ọzọkwa, ọtụtụ ndị ọkammụta n’ihe ọmụmụ agụmagụ
arụtụla aka na mmekọrịta dị n’etiti ndị odee abụ na ọhaobodo
nakwa uru dị iche iche agụmagụ bara n’ịkwalite nchekwa na
ọganiihu obodo. Nwachukwu –Agbada na Okodo atụleela nka
dị iche iche nnukwu odee abụ bekee bụ Ezenwa -Ohaeto si
wee jiri ụfọdụ abụ ikpe ya wee gbaa ọtụtụ akparamagwa ọjọọ
dị iche iche ndị ọchịchị ala Naịjirịa na-akpa n’akwụkwọ abụ
ya ọ kpọrọ I Wan Bi President na If To Say I Bi Soja. (8-9) na
(156-7). N’akwụkwọ abụ ndị a, a ga-asị na Ezenwa-Ohaeto
gbadoro ụkwụ n’usoro ọchịchị nchịgbu e nwere n’obodo
Naịjirịa wee dee ha. Ebumnobi ode abụ ndị a bụ isite n’ọrụ
nka ya wee katọọ akparamaagwa ọjọọ dị iche iche ndị isi
ọchịchị na-akpa ma meghekwa anya ọtụtụ mmadụ ka ha
chọpụta ka ihe si kwụrụ n’ọhaobodo. Dịka ha si wee tulee abụ
a a kpọrọ “If To Say I Bi Soja”, a ga-achọpụta na ode abụ a ji
ikpe wee katọọ mpụ na arụrụala dị iche iche a na-ahụtazi
n’etiti ndị soja ala Naịjirịa. Ọ bụ ihe doro anya na gọọmenti
guzobere ndị soja dịka ndị na-ahụ maka nchekwa ndụ na
akụnaụba ụmụ mmadụ. Mana n’abụ a, ode mere ka o doo
ọhanaeze anya na ndị soja obodo ya ahapụla ọrụ kwesịrị ka ha
rụọ ma bụrụzie ndị fonfonju akpa. Nke a bụ eziokwu maka na
UJAH: Unizik Journal of Arts and Humanities
180
e lee anya n’ihe na-eme n’ala Naịjirịa taa, ọ bụ ihe na-agba
anya mmiri. Otu dị iche iche gọọmenti guzobere ka ha naechekwa
ndụ bụzi ndị na-ala ndụ n’iyi n’eleghị anya n’azụ. Ọ
bụ ọnọdụ dị etu a na-ebute ọgbaghara, oke egwu, ala adịghị
mma n’obodo.
Mmetụta ndị ode abụ na-abụkarị enyo e ji ahụ ụfọdụ
ihe gbasara ndụ na ka ihe si kwụrụ n’ọhaobodo (Akporobaro
37-cool. Ka o sila dị, e nwekwara ndị odee abụ na-ede naanị ka
ha wee zie ọhaobodo ozi dị mkpa (33). N’ịkwado nke a,
Nonye Obi kwuru na agụmagụ nwere ikike ịgbanwe ndụ ọtụtụ
mmadụ n’obodo (60). Ọ kọwakwara na agụmagụ naenyochapụta
obodo ma na-akatọ akparamaagwa ọjọọ ụmụ
mmadụ na-akpa (63).
N’otu aka ahụ, May Okolie kwuru na ọ bụ ihe doro anya na
agụmagụ ndị isi ojii na-aga n’ihu na-akụziri ha ihe dị iche iche
dịka oke na ọrụ dịịrị ha n’ịweghachi ụwa ọhụụ mmadụ azụ
(143-4)
Ka Emenanjo, Onyekaọnwọ na Okediadi Si Ji Abụ Ha
Gbaa Ka ihe sikwụrụ n’Anwụ
N’“Ụkọ N’uju”, odeabụ a ji nhagideokwu wee ziputa aha abụ
a iji gosi na ala adịghị mma n’obodo ya. E leghị anya, ode abụ
a sitere n’abụ wee na-akowa ka ihe si kwụrụ n’ala Naịjirịa.
Site n’aha e nyere abụ a - ụkọ n’uju, a ga-achọpụta na ọtụtụ
ụmụ Naịjirịa ka nọ n’ezigbo ihe ụkọ n’agbanyeghị na
akụnaụba gbọrọ kasaa n’obodo a.
Na nkebi abụ nke mbụ, ode abụ a sitere n’ajụjụ nzaraonwe
wee gosipụta mgbagwoju anya o nwere n’ihi ajo ọnọdụ
ọtụtụ ụmụ Naịjirịa nọ na ya –
Kedụ zi ka a ga-esi nọdụ n’anyịm
Were asọ na-akwọ aka?
Kedụ kwanụ ka a ga-esi nọdụ n’iyi
Agumagu Igbo dika Ngwaoru n'ikwalite ezi Nchekwa na Nkwusiike Ohaobodo
181
Kwere ncha ọ baa anyị n’anya?
Na nkebi abụ a dị n’elu, anyịm na iyi na-anọchite anya
akụnaụba e nwere n’ala Naịjirịa. Nezie, onye nọ n’anyịm
ekwesịghị iji asọ akwọ aka. Onye nọkwanụ n’iyi ekwesighị ka
ncha baa ya anya. Mana ode abụ a ji nkebi abụ a wee zipụta
na ụmụ Naịjirịa na-ahụjụ anya nke ukwu n’agbanyeghị
akụnaụba dị iche iche Chineke ji wee gozie obodo a.
Na nkebi abụ nke abụọ ode abụ sị,
Nkenu bi n’ala na-apịta mmanụ
Karịa ọsa bitọ n’elu
Onye jiri nwayọọ tulee ahịrị abụ abụọ, ọ ga-achọpụta na mpu
na arụrụala, iri akaazụ, ịpụnara mmadu ihe ya n’ike na ihe arụ
dị iche iche juru n’ala Naịjirịa, maka na o nweghị ka nkenu bi
n’ala ga-esi na-apịta mmadụ karịa ọsa bitọ n’elu. Nkenu bụ
anụmanụ na-ebi n’ala, ebe ọsa bụ anụmanụ na-ebi nelu osisi.
A bịa n’ebe ihe na-aga nke ọma, o kwesịrị na ọ bụ ọsa ga naapịta
mmanụ karịa nkenu n’ihi na ebe obibi ya bụ elu osisi, ọ
kachasị n’elu osisi nkwụ. Mana odeabụ a ji ọnọdụ nkenu na
ọsa a wee na-akọwara ọgụụ ma na-egosi na ala adịghị mma
n’obodo a.

1 Like

Re: Agụmagụ Igbo Dịka Ngwaọrụ N’ịkwalite Ezi Nchekwa Na Nkwụsiike Ọhaobodo by scholti: 12:30pm On Dec 07, 2015
Ngaba...

E lee anya n’ahịrịabụ nke iri na isii wee rue na nke iri na
asatọ, odee abụ a jikwa ajụjụ nzaraonwe wee gosipụta
mgbagwoju anya o nwere gbasara ọnọdụ nchekwa nke obodo
a:
Kọọrọ m ihe kpatara na
Mmadụ ga-enwe egbugbere
Ma anwụ ana-ama ya n’eze?
N’ahịrị abụ ndị a, ode ji egbugbere wee nọchite anya
nchekwa. Ode abụ a na-akọwa na e nweghị ezi nchekwa
UJAH: Unizik Journal of Arts and Humanities
182
n’ala Naịjirịa, maka na o nweghị ka anwụ ga-esi na-ama onye
nwere egbugbere ọnụ n’eze. Ebumnobi ode abụ a bụ ka ọ
kọwaara ụmụ Naịjirịa na e nwere akụnaụba ga-ezu ilekọta
onye ọbụla anya, mana ndị ọchịchị dị n’aka ekweghị ka onye
ọbụla keta oke ruuru ya. Nke a mere na ọtụtụ mmadụ naahụsi
anya n’obodo odeabụ.
N’ “Arịrịọ”, odeabụ a ji ikpe, aghụghọ na arịrịọ wee tụnye aro
ihe dị iche iche o chere ga-eweta udo, ezi nchekwa, nkwụsiike
na ọganiihu obodo. Na nkebi abụ nke mbụ na nke abụọ, ode
abụ rụtụrụ aka n’ihe dị iche iche e ji enyere ndụ aka:
Ihe ndị mmadụ chọrọ
abụghị okpokpo bekee na Igbo na-atọ ka ụtụ
ihe ndị mmadụ chọrọ
bụ mmiri a ga-aụ aụ na nri a ga-eri eri
Ihe ndị mmadụ chọrọ
abụghị ama bekee na-ejikarị ube
Ihe ndị mmadụ chọrọ
bụ ụlọ ọgwụ na ụlọ akwụkwọ
ụmụ ha n’akwụghị ụgwọ
nọrọkwa ebe ahụ nweta ihe ndị isi, na-enwetara
ụmụ ha n’akwụghị ụgwọ.
Ihe dịịrị ọsa mma na-adịkwuri uze.
(Emenanjo 30)
Site n’ahịrị abụ ndị a, odee katọrọ okpokpo bekee na asụsụ
Igbo na-atọ ka ụtụ ndị isi ji arafu ndị ha na-achị, ma rịọkwa
ndị isi ka ha nye ndị ha na-achi ezigbo mmiri ọụụ, nri, ụlọ
ọgwụ na ụlọ akwụkwọ ụmụ ha ga-aga n’akwughị ụgwọ.
N’eziokwu, ọ bụ ihe doro ewu na ọkụkọ anya na ọtụtụ ndị
ọchịchị na-eleghara ihe kwesịrị ka ha mee anya ma na-achụ
ikuku ọsọ. Mana ọ bụrụ na ndị isi na-agba mbọ ịhu na ha
nyere ndị ha na-achị ihe dị iche iche e ji enyere ndụ aka dịka
Agumagu Igbo dika Ngwaoru n'ikwalite ezi Nchekwa na Nkwusiike Ohaobodo
183
odee abụ a rụtụrụ aka, a ga-ahụ na udo ga-adịrịrị n’obodo.
Onye elu na onye ala ga-ejikọ aka ọnụ hụ na a kwalitere udo,
ezi nchekwa na ọganiihu obodo.
Arịrịọ na aro odeabụ a yitere otu arịrịọ ndị ntorobịa ala
Naịjirịa rịorịọ onye isi ala, Dr Ebele Goodluck Jonathan ka ọ
rịgooro n’ọkwa n’afo 2011. Mgbe onye isi ala jụrụ ha ihe ọ
ga-emere ha ka ha wee nye aka kwalite udo, ezi mmekọrịta,
nchekwa na ọganiihu nke obodo Naịjirịa, ha rịorịọ onye isi ala
ka o nye ha ọkụ ma kwekwa ya nkwa na ọ bụrụ na o nwee ike
inyenwu ha ọkụ, na ha ga-agba mbọ hụ na mpụ, arụrụala na
akparamaagwa ọjọọ dị iche iche e ji mara ndị ntorobia gaabụzi
akụkọ mgbe ochie n’ala Naịjirịa. Ọ dịziiri okeke na
okafọ ịkọwa ma onye isi ala emezuru arịrịo a ndị ntorobịa
rịorịọ ya. Nke a na-egosi na akparamaagwa ọjọọ dị iche iche
ndị isi na-akpa bụ ihe kacha ebute ala adịghị mma n’obodo.
“Naijirịa bụ enyi mba” odeabụ a ji aghụghọ, otito na
egbeokwu wee katọọ ọnọdụ ọjọọ obodo Naịjirịa nọ na ya. Na
nkebi abụ nke mbụ, odee abụ kọwara ka ihe si kwụrụ n’ala
Naịjirịa. O gbasoro ụzọ ikpe wee katọọ ụdị ajọ ụzọ e nwere
n’ala Naịjirịa.
Na nkebi abụ nke abụọ, odee ji atụmatụokwu a naakpọ
ekwuecheọzọ wee katọọ ọnọdụ enweghị ezi nchekwa,
ime mpụ na arụrụala na mkpagbu juru ala Naịjirịa. Site n’ahịrị
abu ndị a na-esote, a ga-achọpụta na e nweghị ezi nchekwa
n’ala Naịjirịa:
Naịjirịa bụ Enyimba
Obodo achọghị mmegbu
Lee! Ọnwụ ụmụ akwụkwọ
Ndị uwe ojii gbagbusiri
Na Soweto
Na-agba ya anya mmiri
UJAH: Unizik Journal of Arts and Humanities
184
N’ihi na a hubeghị
Ihe dị otu a na ya.
(Onyekaonwu, 2003)
Onye ọbụla ji nwayọ wee gụọ ahịrị abụ ndị a dị n’elu nke
ọma, ga-achọpụta na ode abụ a ji ha akatọ ka ihe si kwụrụ
n’ala Naịjirịa. A tụrụ anya na oke na ọrụ ndị uwe ojii
n’obodo ọbụla bụ ichekwa ndụ na akụnaụba ụmụ mmadụ.
Mana a bịa n’ala Naịjirịa, a ga-achọpụta na ụfọdụ ndị uwe
ojii so na ndị na-ala ndụ ụmụ mmadụ n’iyi n’ụzọ ezighị
ezi. Ọnọdụ dị etu a bụ ihe jọgburu onwe ya. Odee abụ a
mekwara ka a mata na ala Naịjirịa na obodo Soweto dịka
ụmụ ejima n’ebe o metụtara ime mpụ na arụrụala.
Ebumnobi odeabụ bụ ka o site n’abụ a gbaa mpụ na
arụrụala juru ala Naịjirịa n’anwu, ka ụmụ Naịjirịa soro ya
wee katọọ ajọ ọnọdụ ndị o zipụtara n’abụ ya ka udo wee dị
n’ala Naịjirịa.
N’“Naịjirịa”, odeabụ a ji ya wee zipụta echiche na mmetuta o
nwere gbasara ala Naịjirịa. O ji nkebi abụ nke mbụ na nke
abụọ wee kọwaa na Chineke ji ngọzị pụrụ iche we chọọ obodo
Naịjirịa mma:
Obodo mmanụ aụ
Mmiri ara ehi
na-eru n’ime ya
Akụnaụba ka Eke ji chọọ gị mma
Ala ọma bụkwa ugwu nye gị. (Okediadi 2003)
N’ezie, Naịjirịa bụ otu obodo Chineke ji ụdị ngọzị dị iche
iche wee chọ mma. Mana, n’ihi echekwaghị ngọzị ndị a
nke ọma, ọtụtụ ụmụ Naịjirịa na-ahụsi anya n’ebe ọ dị
ukwu. Ndị ọchịchị nchigbu ekweghị na ala ga-adị mma,
Agumagu Igbo dika Ngwaoru n'ikwalite ezi Nchekwa na Nkwusiike Ohaobodo
185
dịka ode abụ a si kwa arịrị na nkebi abụ nke atọ, nke anọ
na nke ise:
…..
Ndị ọchịchị nchigbu
Ụnụ eteela ala anyị unyi n’ihu
…..
Chei! ụnụ bụ anwụta
Ụnụ amịkpọọla ụmụ mmadụ ọbara
….
Ndị oke ọchịchọ!
Ụnụ hiwere amụma dị iche iche
Ọ bụ nke gịnị?
Inyere ndị ụwa na-atụ n’ọnụ aka.
Onye ka o rukwaru aka?
N’akpa ụnụ ka ha bachara
Ndị ọchịchị nchigbu ndoonu! (Okediadi 20-1)
Odeabụ a ji ahịrị abụ ndị a wee gosịpụta na ọ bụ ndị ọchịchị
nchịgbu na-ebute ala adịghị mma n’obodo Naịjirịa. Ebumnobi
ya bụ ka a katọọ akparamaagwa ọjọọ dị iche iche ndị ọchịchị
nchịgbu na-akpa, ka e wee chụọ ha ọsọ ụkwụ eru ala; ka udo
na ọganiihu wee dị n’ala Naịjirịa. Ezi ndị ọchịchị bụ ndị naechekwa
ndị ha na-achị nke ọma. Mana ode abụ a gosipụtara
ndị ọchịchị nchịgbu Naịjirịa ka anwụ nta na-amịkpọ ọbara ndị
ha na-achị.
A bịa n’ala Naịjirịa taa, arụ na-atụzi ime, na-amụsa ụmụ ebe
niile. A maghịzi ka a ga-esi kwọ onye ukwu wara. Mpụ,
arụrụala na akparamaagwa ọjọọ dị iche iche juru
elu na ala. E nweghị nchekwa maọlị. A na-akwafuzi ọbara
ụmụ mmadụ ka mmiri. N’ezie, a maghị nke a ga-ekwu ghara
ibe ya.
UJAH: Unizik Journal of Arts and Humanities
186
Nchịkọta, Nchọpụta na Aro
Abụ niile a tụlere n’edemede a zipụtara ma rụtụchakwa aka ka
ihe si kwụrụ n’obodo Naịjirịa taa. Ndị odee abụ ndị a sitere
n’ụzọ ikpe na aghụghọ wee katọọ akparamaagwa ọjọọ dị iche
iche ndị isi ọchịchị na-akpa, nke na-ebute ọgbaaghara, ala
adịghị mma, adịghị n’otu, enweghị ezi nchekwa na
mmekọrịta. Ha gara n’ihu rụtụkwa aka n’ụzọ dị iche iche a gaagbaso
wee nweta ezi nchekwa na ọganiihu n’obodo Naịjirịa.
Nke a na-egosi na agụmagụ Igbo, ọ kachasị abụ ederede Igbo
bụ nnukwu ngwaọrụ n’ịkwalite ezi nchekwa, mmekọrịta,
nkwụsiike na ọganiihu obodo. Ka o sila dị, site n’edemede a, a
chọpụtara na ọ dị ọtụtụ ozi na aro dị nnukwu mkpa ndị ode
abụ Igbo na-atụnye site n’ọrụ nka ha; ọ kachasị etu o si metụta
ụzọ dị iche iche a ga-agbaso wee nweta udo, ezi ọchịchị,
mmekọrịta n’etiti ndị isi ọchịchị na ndị a na-achị achị, ezi
nchekwa, nkwụsiike na ọganiihu obodo. N’ihi nke a, ọ dị
nnukwu mkpa ka ndị ọchịchị na ndị a na-achị achị na-ewepụta
ezigbo ohere wee na-agụ abụ Igbo ndị a iji chọpụtasịa ozi na
aro ndị ahụ ma gbaa ezi mbọ na-etinye ha n’ọrụ. Nke a gaenye
aka belata mpụ, arụrụala na akparamaagwa ọjọọ dị iche
iche juru obodo a ma kwalite ezi mmekọrịta, udo, ezi
nchekwa, nkwụsiike na oganiihu nke obodo Naịjirịa.

Nkoli Mercy Nnyigide
Ngalaba Ihe Omụmụ Igbo, Afrịka na Eshia
Mahadum Nnamdị Azikiwe, Ọka
nkolimercy@gmail.com
Agumagu Igbo dika Ngwaoru n'ikwalite ezi Nchekwa na Nkwusiike Ohaobodo
187
Nrụtụaka
Akporobara, F. Introduction to Poetry. Ikeja: Princeton, 2008.
Ekwealor, C. Agụmagụ Ederede Igbo. Nsukka: Paschal
Communications, 2009.
Emenanjo, Nolue. Ed. Utara Nti. Ibadan: Evans Brothers,
1979.
Jenkwe, Emmanuel. “Poetry of Social Advocacy as a Tool for
National Development”. Language and Literature
in a Developing Country. Ed. Anasiudu, B. et al.
Ibadan: Africana – First Publishers, 2007. 165.
Nwachukwu-Agbada, J. “Ezenwa-Ohaeto, The Poet and
National Development: Implications for African
Literature of the Twenty-First Century”. African
Literature and Development in the Twenty-First
Century. Ed. Joy Eyisi et al. Owerri: Living
Flames Resources, 2009. 8-9.
Nwadike, Uzoma. Agụmagụ Ọdịnala Igbo (Igbo Oral
Literature). Nimo: Rex Charles & Patrick, 2003.
________ Ntọala Agụmagụ. Nigeria: Ịfunanya Publishers,
1992.
Obi, Nonyelum. “The Role of Literature in National
Development”. African Literature and
Development in the Twenty- First Century. Ed. Joy
Eyisi et al. Owerri: Living Flames Resources,
2009. 61-3.
Okediadi, Nkechinyere. Ije Ụwa. Enugu: Fulladu Publishers,
2003.
Okodo, Ikechukwu. “The Contributions of Ezenwa Ohaeto to
Literature Studies”. African Literature and
Development in the Twenty-First Century. Ed. Joy
Eyisi et al. Owerri: Living Flames Resources,
2009. 156-7.
Okolie, May. “French Language, African Literature: A
Perspective in Education for National
UJAH: Unizik Journal of Arts and Humanities
188
Development”. Language and Literature in a
Developing Country Ed. Anasiudu, B. et al.
Ibadan: African – First Publishers, 2007. 143-4.
Onyekaonwu, Goddy. Uche Bụ Afa. Onitsha: University
Publishing Company, 2003.
Uba – Mgbemena, Asoonye. Echiche. Ibadan: Gold Press,
2012.

1 Like

Re: Agụmagụ Igbo Dịka Ngwaọrụ N’ịkwalite Ezi Nchekwa Na Nkwụsiike Ọhaobodo by Sabina042: 11:12am On Nov 17, 2019
Chukwu gọzie gị ezigbo onye nkụzi m

(1) (Reply)

Kegite Club: Introduce Yasef Via Ur Numencleture, Ilya & Kariability / Labor Day Parade In Ny / Kwanzaa

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 69
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.