Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,158,294 members, 7,836,286 topics. Date: Wednesday, 22 May 2024 at 02:53 AM

Igbo Folktale: Mbe Na Chukwu Mara Aka! - Culture - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / Igbo Folktale: Mbe Na Chukwu Mara Aka! (4057 Views)

The Story Of The Wise Leopard King (Igbo Folktale) / Mbe Follows Nkita To The Wresting Fair. ( Igbo Folktale) / Eze Chukwuemeka Eri, Aka Ji Ovo Igbo Leads Community To Omambala River (2) (3) (4)

(1) (Reply)

Igbo Folktale: Mbe Na Chukwu Mara Aka! by myklangelo(m): 7:32pm On Oct 22, 2016
Tata anyị ga-akọ akụkọ ifo. Akụkọ ifo na-ànwụ ànwụ n’ala Igbo. O dizie ka a ga-asị na ndị ọ bụ oke na ọrụ ha ịhụ na ihe dị otu a emeghị, amaghịzị ọrụ ha. Ndị ga-emenwu ka ịkọ akụkọ ifo werekwa ọnọdụ n’omenala anyị bụ ndị nne na nna. Ha ka ọ dịrị, ọ nọkata ha akpokuo ụmụaka ha, nọdu ha ala, ma kọọrọ ha akụkọ ifo. Mgbe ha mesiri nke a, ha ga-ajụ ajụjụ ma hụ na ụmụaka ha nwere ihe ha mụtara. Mana ndị nne na nna ole ka ma akụkọ ifo Igbo ma ya fọdụzie ịkọ ya akọ?

Nanị akụkọ ọtụtụ ndị nna ma maka ya ugbu a bụ maka nke egwuregwu futubọọlụ na ihe gbasara ndọrọ ndọrọ obodo. Nke ndị nne ma maka ya ugbu a bụzi nanị maka ihe mere na Afrika Majiki na nke ọzọ mụ amaghị ihe ha na-akpọ ya. Odeniigbo ga na-akọ akụkọ ifo na ọ dịkata ebe a. Ebumnobi m bụ, i gụsịa ya, i kọọrọ ya ụmụaka gị. Ebumnobi m bụkwazi ka anyị bido kọbara ụmụ anyị akụkọ ifo, ihe di mma kwesiri ka a na-eme ha.

Ka anyị gbapụ ya ọsọ...

MBE NA CHUKWU MARA AKA!
Ifo dee!........................................... i dee
O nwere otu ụbọchị...........................Otu ụbọchị eruo
Nkịta nyara akpa?................................ nsị agwụ n’ọhịa!

Mgbe gboo, mgbe ụzọ esi aga na nke Chukwu bụ ihe doro ewu na ọkụkọ anya. Mbe kwadoro gaa na be Chukwu dị ka o si eme kwa afọ. Ka o rutere, Chukwu tinyere aka n’akpa wepụta nkume choo ya n’ihu, sị ya were waa ọjị. Hmmm Mbe lelie anya elu, ma ledekwa anya n’ala. O kwuo sị, “onye ekoteghi, ọgọdọ ekotere ya”.

Ọ pụọ n’ilo were gwọta ajụ, mgbe ọ batara n’ụlọ, o nye ya Chukwu were sị ya, “Ọga m, were ajụ a buru ala buga ya ebe ọzọ”. Chukwu akpọọ n’ubu, jụọ Mbe sị, “mmadụ a na-ebu ala ebu, ọ bụ ibu?”. Mbe amụrịa were jụọ Chukwu, “Nna m biko a na-awa nkume awa, ọ bụ ọjị?”. Chukwu kpọọ n’ubu maka n’ihe onye ma ka ibe ya ma.

Chukwu bara n’ime ụlọ ya pụta, sị mbe, “nwa m biko o nwere ozi m chọrọ ka i jere m”. O were otu akpa nye mbe sị ya, were ego a gbatara m ńkwụ enu ndị Nsude. Ọ gara n’ihu gwa ya ka ọ ghara ịgbanye ya bụ mmanya n’ite màọbụ n’ekpe mmanya. Hmmm o gwụbeghịkwa oh! Ọ sịrị mbe na ọ na-abịa ya e sikwara n’ụzọ màọbụ n’ọhịa; ka mmanya ahụ ghara iju eju, ka ọ ghara idi n’ọkara màọbụ n’ike ihe o ga-agbanye ya! Ọ gwakwara ya, “biko nwa m, abịakwara n’ụtụtụ, mà ọ bụ n’ehihie màọbụ abalị”. Ihe nke a dịkwa egwu! Ọ bụrụ gị kedu ihe i ga-eme?

Mbe nara Chukwu ego ahụ were pụọ. Anyị maara nke ọma na “eee” anaghị ese okwu. I hụ Mbe ụbọchị ahụ i mara na nwoke n’ihe na-eme. O chere echiche miri emi, were cheta ihe o ga-eme. Mbe abụghị nwata n’ihe gbasara aghụghọ. Ọ gara gbanye mmanya ahụ n’ikwe o ji asụ akpụ. Mgbe ụbọchị dị na etiti ndeeli, o gburu mmanya ahụ, si mpio dị na be, gara n’apịtị ruo na nke Chukwu. Mbe rutere sị, “Chukwu Abịama lekwa mmanya i tụrụ m n’ahịa”. Chukwu lesịa mbe were sị ya, “nwoke m, ọ na ịdịghị anụ ihe? A gwara m gị ejila ụtụtụ were bịa”. Mbe aza ya sị, “ugbu a, ọ bụ ụtụtụ? Ka ọ bụ ehihie?”

Chukwu ajụkwa ya, “kama ọ kwa m gwara gị, esila ọhịa màọbụ ụzọ were bịa?” Okwu anaghị akọ Mbe n’ọnụ, ọ zaa Chukwu, “ Nna m, esighi m ebe ndị a, ebe m si were bịa bụ na mpio nke were ọwa mmiri ideyi”. Okwu abụghị obere ihe. Oke ebuli abụọ na-akụkọ mpi. Chukwu jụrụ Mbe, “ọ kwa m gwara gị ka mmanya ahụ ghara iju eju ma ghara ịdị ugwu?”. Mbe were nwayọọ ga, kpọghute ya bụ ikwe, mmanya juru n’otu akụkụ ma pee mpe n’akụkụ nke ọzọ. O kwuru sị na nwunye di chọba ibe ya okwu o sị ya, ya nye ya mmanụ ka o were taa akwụ. Chukwu kwere n’isi were sị na taata bụ taata, onye gbaa ọsọ, ka ukwu kwaa ya!

Ka Mbe richara nri na be Chukwu, o were ọkụkọ; oke na nwunye nye Mbe. Mbe kene Chukwu, ma tupu Mbe atụpụ ụkwụ ụna, Chukwu gwara ya na tupu otu afọ agasịa, na ya nwụtara ya ya bụ ọkụkọ, na mgbe ahụ na okeọkpa ahụ ga-eyi akwa ma nnekwu ọkụkọ ahụ ga na-akwazi ka okeọkpa. Hmmm ihe nke a ihe kwo! Mbe nara Chukwu ya bụ ọkụkọ. Ọbụghị taata ka ahụbara Aụsa na ụta.

Ka otu afọ n’elu. Agha akara aka, anaghị eri nwa ngwọrọ. N’otu ụbọchị Mbe gara n’ahịa, nọkata tibe nnukwu mkpù, na-ebe akwa, na-akpụtọsị onwe ya n’ala. Mgbe ndị mmadụ jụrụ ya kedu ihe na-emenụ? Mbe were nwayọọ chịkọnata onwe ya ọnụ were kwuo, “ ndi nke m, papa m nwụrụ n’ime mgbe o na-amụ nwa; ka nne m nụrụ akụkọ a n’ihu agha, ebe ọ bụ ọchịagha ọ dara n’ala ọ bụrụ ọnwụ!”.
Hahahaha!

Chukwu nọrọ ebe ọ nọ were nụ ihe nke a, were tikpuo Mbe nnukwu mkpù dara ka egbiigwe, jụọ Mbe si, “nwoke a na-amụ nwa? Mbe!, nwaànyị a na-aga agha?”. Mbe amụrịa nnukwu amụ, were jụọ Chukwu. “Oke ọkụkọ, o na-eyi akwa? Nne ọkụkọ o na-akwa akwa?”.

Onye aghụghọ nwụọ, onye aghụghọ enyie ya. Iko onye ji akpanyere ndị ọzọ ka a ga-eji were kpanyere ya. Anụ gbaa ajọ ọsọ, a gbaa ya ajọ egbe. Nke a bụ etu Mbe siri were gosi ụwa nile ụdị amamihe dị ya n’isi. Mbe abụghị onye ụjọ na-atụ na ọ bụrụ ihe eji isi were echepụta. Uche bụ akpa, onye ọbụla nya nke ya.
Chakpiiii....... wọọọ!


Onye ọbụla o masiri nwere ike ịkwado nkọrọ a maka asụsụ Igbo.


To read more, visit www.odeniigbo.com . Do not copy without acknowledging and notifying, to reproduce and type this is not a child's work.

3 Likes 1 Share

Re: Igbo Folktale: Mbe Na Chukwu Mara Aka! by Nefefe: 9:00am On Jun 30, 2022
I meela! Chukwu gozie gi

1 Like

(1) (Reply)

Some Igbo Words In Olaudah Equiano's Autobiography Book / Skunk And Codeine: The New Trend For Nigerian Girls / Sun And Spirituality: Is There A Connection?

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 18
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.