Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,162,328 members, 7,850,166 topics. Date: Tuesday, 04 June 2024 at 03:34 PM

E Kwuola Mkpa Ọ Dị Inyocha Ụgbọala Oge Ọbụla - Culture - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / E Kwuola Mkpa Ọ Dị Inyocha Ụgbọala Oge Ọbụla (366 Views)

Transportation In Yoruba Land (àwọn Ọ̀nà Tí À Ń Gbà Rin Ìrìn Àjò) / Excerpt From The Osun Osogbo Festival ( Ọ̀sun Òṣogbo) 2021 / APPRECIATION The 1st Omidan Oge 2019 (2) (3) (4)

(1) (Reply)

E Kwuola Mkpa Ọ Dị Inyocha Ụgbọala Oge Ọbụla by IzunnaOkafor(m): 9:13pm On Jun 30, 2018
Izunna Okafọr

A kọwaala mkpa ọ dị ịdị na-enyocha ụgbọala na ndị na-akwọ ụgbọala oge ọbụla iji hụ na ha nọ n'ezi ọnọdụ, na iji wee bèlata ihe mberede okporo ụzọ.
Kọmishọna na-ahụ maka ime njem na steeti ahụ bụ Maazị Uchenna Okafọr mere ka a mara nke a n'isi ụlọ ọrụ na-ahụ maka inyocha ụgbọala na steeti ahụ dị n'Awka, ma kwuo na e nwere akụrụngwa zuru oke n'ụlọ ọrụ ahụ iji nyocha ma ịhụ na ụgbọala nọ kwụ n'egwu na steeti ahụ. Ọ gakwara n'ihu kwuo na e nwere ọtụtụ ebe dị iche iche a na-agbata akwụkwọ ikike e ji akwọ ụgbọala na steeti ahụ, bụ nke ruru iri anọ n'ọnụ ọgụgụ, ma dụọ ndị na-akwọ ụgbọala ka ha ga gbata akwụkwọ ikike ha n'ebe ndị ahụ, karịa ịga adabà n'aka ndị adịgboloja na ndị na-egwu ojoro.
Ọ katọkwara otu ndị na-akwọ ụgbọala na steeti si enwe ntị ike na mgbakụta azụ banyere ụfọdụ ihe ha kwesiri na steeti ahụ, ma kwuo na minịstrị ahụ na ụlọ ọrụ ndị ọzọ ya na ha na-arụkọ ọrụ agaghị egbu oge ịnwụchikọ one na-ada iwu.
Na ntụnye nke ya, onyeisi otu ahụ na-ahụ maka ije awele na steeti ahụ, bụ maazị Sunday Ajayi kpọkuru ndị nwere ụgbọala ka ha nyochaa akwụkwọ ikike ha site n'ụzọ nzikọrịta ozi ọnyanwududo ma ọ bụ n'isi ụlọ ahụ na-enyocha ụgbọala, n'ihi na nke ahụ ga-enyere ndị ọrụ ya aka ịma ọnụ ọgụgụ ụgbọala ndị bụ nke gọọmenti nwe, nakwa nke ndị ji ụgbọala akpa ego na ndị nnọrọ onwe, ma kpọkukwa ha ka ha nyere ndị ọrụ ha aka.
N'okwu nke ya, onyeisi ụlọ ọrụ ahụ na-enyòcha ụgbọala, bụ maazị Chris Okeke kpọpụtara inyocha ọkụ ụgbọala, ọnọdụ ụkwụ ya, ikike nkwụsị ya na ihe ndị ọzọ dịka isi sekpụ ntị n'ihe ha na-enyòcha iji hụ na ụgbọala tozuru oke ịgba n'ụzọ, ọ bụnadị dịka o mere ka ndị na-akwọ ụgbọala mara na ha nwezịkwara ike isite n'ụzọ ikuku na ọnyanwududo wee debanye aha ụgbọala ha n'akwụkwọ.
Ndị ọzọ kwuru okwu n'ọgbakọ ahụ gụnyere onyeisi otu Ọcha Brigade bụ maazị Patrick Obiefuna, ogbò ya nke otu na-ahụ maka Ịdị Ọcha na Ahụike Anambra, tinyere nke na-ahụ maka ezi ọnọdụ obibi ndụ ndị na-akwọ ụgbọala na steeti ahụ, bụ ndị kwugbadoro ma rịọ ka e buru ozi ahụ niile wee baa n'ime obodo ma mee ka o ruo ntị ọbụla kwesiri ịnụ ya.
A nọkwazịrị na mmemme ahụ wee gbapee akụrụngwa pụrụ iche a ga-eji na-enyocha ụgbọala n'ụlọ ọrụ ahụ.

2 Likes

(1) (Reply)

PositiveNaija Top News: Week 31, 2018 / The Power Of Attitude. / Children Performing: In Tiv Land Children Are Not Left Out Of The Tradition

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 11
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.