Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,161,447 members, 7,846,862 topics. Date: Saturday, 01 June 2024 at 04:36 AM

Anya Mmiri Ala Anyị (the Tears Of Our Land) - Culture - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / Anya Mmiri Ala Anyị (the Tears Of Our Land) (667 Views)

“imo State People Are The ‘yorubas Of Ala Igbo’” / Best Capital Of Ala Igbo / Who Are Eke, Orie,afo Na Nkwo: Agwu, Amadioha, Ogwugwu And Ala? (2) (3) (4)

(1) (Reply)

Anya Mmiri Ala Anyị (the Tears Of Our Land) by IzunnaOkafor(m): 8:53am On Jan 29, 2019
Izunna Okafọr

Ala Naịjiria ebegbuo onwe ya n'akwa
Anya mmiri anya mmiri ebe niile
Akwa ụtụtụ, akwa ndeeri na akwa arịrị
Ọnye ga-azọ ala anyị ?

Chi ọbụbọ were aka ekpe were dupụta ya ụra
Chi ọjọọ ewere akwa arịrị dúbàà ya
Ihe na-ebenụ aka na-ebekwa
Onye ga-azọ ala anyị ?

Naịjiria bụ nne chị ụmụ
Ndị ọchịchị bụ di bi ụlọ
Nne na nwa ebegbuo onwe ha n'akwa
Agụụ, anya mmiri, akwa arịrị ebe niile
Onye ga-azọ ala anyị ?

Lekene nwaanyị na mma ya
Na ụbara ụmụ chi jiri gọzie afọ ya
Ma di ya ekweghị ka o rite ihe nwa ya
Wee na-amị ya ọbara ka anwụnta Nnewi
Onye ga-azọ ala anyị ?

Ezi na ụlọ ya nọ n'ọgbaghara
Ma di ya adịghị emezị ka nwoke
Egbe ebukọchaala ụmụ ya na Benue, Dapchi na Chibok
Ma di ya ekwughị ihe ọbụla ma ọlị
Dịka a gà-asị na ọ macha ihe na-eme
Onye ga-azọ ala anyị ?

Di ya ezugbuola ohi, ma bube ya ọnụ nri
Ụmụka nọzịkwa n'agụụ, ọbụnadị n'ikpo nri ha nwèrè
Ya bụ ògòlì nwaanyị agbaa isi awọ na-erughị eru
Anya mmiri ejugokwa ọgọdọ ya
Onye ga-azọ ala anyị ?

Nwoke ahụ agbaala ya ọtọ n'ọmà ahịa
Chaị !
Agụ nwaanyị ebegbuo onwe ya n'akwa !!
Dịka ụwa na-agbázịkwa ọtọ ya elele
Ùgwù e jiri mara ya erughịzịkwa ya aka
Onye ga-azọ ala anyị ?

Ala Naịjiria na-achọ dí ọzọ ugbu a
Ndị ọ lụrụ alụ agharịpụchaala ya
N'ihi ezughị oke n'ihe e ji nwoke eme
Nke bụ isi anaghị echètekwuzịkwa onwe ya
N'ihi ụbụrụ ịta nchara
Na ihe a gwọrọ agwọ so ya
Onye ga-achị ala anyị ?

Iwe eweela ụmụ ya ndị okenye
Ha ji achọrọ nne ha di ọzọ n'oge
Naanị nwoke nwere ùgwù na nsọpụrụ
Ka a na-elegara anya ibunye mmanya ụbọchị ahụ
Ma e wepuchaa úgwùmágànà na ndị otu ya.
A jụọ m ụnụ, onye ga-azọ ala anyị ?

Gị onwe gị sòrò bụrụ nwa ya
Mụ onwe m sòrò bụrụ nwa ya
Ngịga dị n'ọkụ abụghị nkè azụ
Ọ bụrụ nkè anụ
Ụmụnne m a jụọ m ụnụ ọzọ
Onye ga-alụ mma anyị ?

Oke ji na àbàlà ọ na-azọ ihu ọba ?
Ngwa jikere ma chemie echiche nke ọma
Ka i wee sòró anyị zaa ajụjụ ahụ n'oke ụbọchị ahụ
Onye ga-achị ala anyị ?

© Izunna Okafọr

(1) (Reply)

Gorillas In Nigeria: World's Rarest Great Ape Pictured With Babies / Fact Check: Does The Benin Custom Prevent The Oba Of Benin From Traveling? / Help With Ibibio Translations Please.

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 8
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.