Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,152,474 members, 7,816,118 topics. Date: Friday, 03 May 2024 at 05:38 AM

Akpaala Okwu (idioms). - Culture - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / Akpaala Okwu (idioms). (35306 Views)

Yoruba Idioms: Owe Yoruba, Itunmo Re Ati Lilo Re / Okwu Ntabi Ile / Igbo Idioms (Ilu) (2) (3) (4)

(1) (Reply) (Go Down)

Akpaala Okwu (idioms). by AndreUweh(m): 11:40pm On Nov 01, 2010
Akpaalaokwu bukwa okwu nke ndi Igbo ji acho asusu ha mma. Ndi Igbo ji akpalaokwu amata onye maara ihe nke oma. N'ihi yao kwesiri ka onye o bula bu nwaamaala Igbo, ma onye o bula na-amu asusu na omenaala Igbo muta nke oma ihe bu akpaalaokwu na otu esi eji ya ekwu okwu n'asusu Igbo.
Re: Akpaala Okwu (idioms). by AndreUweh(m): 11:46pm On Nov 01, 2010
O na-eme aka abuo. Nkea putara na o na ezu-ohi.
Oji aka ya abuo eme ihe abughi ya chaa chaa. Otu ahu i siri nu ya abughi ka i ga-esi kowaa ya.
Re: Akpaala Okwu (idioms). by AndreUweh(m): 11:50pm On Nov 01, 2010
Ndi Igbo, ka anyi leba anya n'ufodu akpaala okwu e nwere n'asusu Igbo ma nyekwa nkowa ha n'otu na otu.
Ka Chukwu dube anyi.
Re: Akpaala Okwu (idioms). by AndreUweh(m): 12:41am On Nov 02, 2010
Obi iji oji (obi ya na-eji oji)---onwere ajo obi.
Re: Akpaala Okwu (idioms). by ifyalways(f): 8:42am On Nov 02, 2010
O dim ka e nwere theadia already,a dighim sure undecided
Nsogbu adighi.
@Topic,Ikomi yiri Ozodimgba Ikomi is extremely U.gly
Nkechi bu abu na anwu Nkechi is lazy/not industrious

Dede Andrew,Gini bu akpalaokwu na Bekke?Simile undecided
Re: Akpaala Okwu (idioms). by AndreUweh(m): 12:28pm On Nov 02, 2010
ifyalways:

O dim ka e nwere theadia already,a dighim sure undecided
Nsogbu adighi.
@Topic,Ikomi yiri Ozodimgba Ikomi is extremely U.gly
Nkechi bu abu na anwu Nkechi is lazy/not industrious

Dede Andrew,Gini bu akpalaokwu na Bekke?Simile undecided
Akpaalaokwu bu IDIOMS.
Re: Akpaala Okwu (idioms). by AndreUweh(m): 2:47pm On Nov 02, 2010
onya imata nkapi (onya ya matara nkapi)--onwetaghi ihe o na-acho.
Re: Akpaala Okwu (idioms). by Nobody: 2:53pm On Nov 02, 2010
ifyalways:

O dim ka e nwere theadia already,a dighim sure undecided
Nsogbu adighi.
@Topic,Ikomi yiri Ozodimgba Ikomi is extremely U.gly
Nkechi bu abu na anwu Nkechi is lazy/not industrious

Dede Andrew,Gini bu akpalaokwu na Bekke?Simile undecided

Lol . . Nke a' ka ana akpo engili-igbo! grin
Re: Akpaala Okwu (idioms). by ifyalways(f): 12:07pm On Nov 06, 2010
Andre Uweh:

Akpaalaokwu bu IDIOMS.
dalu.
Ujujoan:

Lol . . Nke a' ka ana akpo engili-igbo! grin
I dee nani igbo tara akpu. cheesy
@Topic,Aka akparala Nkapi . . To be caught red-handed.
Re: Akpaala Okwu (idioms). by AndreUweh(m): 1:04am On Nov 07, 2010
Obi Iji Oji (obi ya na eji oji)--inwe ajo obi (onwere ajo obi).
Re: Akpaala Okwu (idioms). by ifyalways(f): 10:28am On Nov 09, 2010
O na eme aka ntutu . . hes a thief.
Strictly Onitsha dialect.
Re: Akpaala Okwu (idioms). by youngies(m): 3:29pm On Nov 09, 2010
Ify tara amu ebule -
Re: Akpaala Okwu (idioms). by ifyalways(f): 4:26pm On Nov 09, 2010
Youngies na apu ala angry
@Topic,Okeke foro ntutu ta . . .Okeke refused to have a change of mind/refusing to change ones stance on sumtim.
Re: Akpaala Okwu (idioms). by AndreUweh(m): 7:20pm On Nov 09, 2010
ifyalways:

Youngies na apu ala angry
@Topic,Okeke foro ntutu ta . . .Okeke refused to have a change of mind/refusing to change ones stance on sumtim.
Ify, akpalaokwu gia kara aka, kajakwa akaja.
Re: Akpaala Okwu (idioms). by AndreUweh(m): 7:24pm On Nov 09, 2010
Ile ajo anya (o na ele ajo anya)---inwe echiche ojoo (ona enwere ya echiche ojoo).
Re: Akpaala Okwu (idioms). by ChikiChik(f): 10:36am On Nov 10, 2010
Edi soro ya onu O bu onye nzuzu

1 Like

Re: Akpaala Okwu (idioms). by ChikiChik(f): 10:40am On Nov 10, 2010
O nwu obu naka wee bia O biara noge
Re: Akpaala Okwu (idioms). by AndreUweh(m): 2:21pm On Nov 12, 2010
I go si mmadu eluigwe (agam ezi gi eluigwe)--nkea putara na agam emesi gi ike.
Re: Akpaala Okwu (idioms). by AndreUweh(m): 11:24pm On Nov 13, 2010
Onu idi n'oku--Aguu igu.
Re: Akpaala Okwu (idioms). by ifyalways(f): 3:57pm On Nov 14, 2010
Aga m ezi gi ihe oku ji nti oke eme . . .Imesi mmadu ike.(being mean)
Re: Akpaala Okwu (idioms). by AndreUweh(m): 7:09pm On Dec 05, 2010
Ichi obi na aka (ochi obi n'aka)---Iche uche (o na eche uche).
Re: Akpaala Okwu (idioms). by AndreUweh(m): 8:36pm On Apr 30, 2011
Anya ika aka (anya kara m aka) -Atughi egwu (egwu anaghi atu m).
Re: Akpaala Okwu (idioms). by AndreUweh(m): 4:12pm On Oct 14, 2011
Ita akwa ndu (o na-ata akwa ndu)--izuzu ezuzu (o na-ezuzu ezuzu).
Re: Akpaala Okwu (idioms). by ifyalways(f): 9:15am On Oct 15, 2011
Igba Uche na nkpo:to be too cautious,wise and cunny.
Re: Akpaala Okwu (idioms). by AndreUweh(m): 1:07pm On Dec 11, 2012
Isi inu oku---ighota ihe oso oso.
Re: Akpaala Okwu (idioms). by achi4u(m): 1:49am On Dec 13, 2012
ukwu jie agu mgbada abia ya ugwo...(ihe siere madu ike onye obula akpariba ya)

Ala adighi mma bu uru ndi nze...(madu iji oke ihe odachi merenu mere uru ya)

Mgbada dara ibi bu uru dinta......?
Re: Akpaala Okwu (idioms). by odumchi: 4:04am On May 07, 2015
Igbo ndi nwe m, unu gbazuo ka anyi mezie threadi a n'ihie na ihe di nma di na ya.

Akpaala okwu ozo di kwa na okwu Igbo bu kwa:

"Mbosi nta anyi achoonu ohere nchi" - Ya bunu ka ihe diriwa ka esiri kpaa ya.
Re: Akpaala Okwu (idioms). by odumchi: 4:07am On May 07, 2015
Biko, onye chetakwuru ndi ozo, ya kaa bia dee. Dee Andreh Uweh, gi bunu nna anyi ukwu meheere anyi thredi oma a kemgbe afo ise gara aga, I bu onye nmanma.
Re: Akpaala Okwu (idioms). by Nobody: 10:33am On May 07, 2015
Nwata ahu na akpa ebe ewu si efu.(Nwata ahu na eso ujo joro njo)

Nkita anaghi eri nsi ya(ihe ya anaghi abara mmadu)

Obinna bu azu eru ani(Obinna siri ike nke ukwuu)

Ifeoma di ani nso (Ifeoma etoghi ogologo)

Udara ahu na ama ura na nti-cheek (Udara ahu atoghi uto cha cha, ona agbaka nti-cheek).

Emeka bu iziga( Emeka toro ogologo)

odumchi:
Biko, onye chetakwuru ndi ozo, ya kaa bia dee. Dee Andreh Uweh, gi bunu nna anyi ukwu meheere anyi thredi oma a kemgbe afo ise gara aga, I bu onye nmanma.
Re: Akpaala Okwu (idioms). by odumchi: 9:48pm On May 07, 2015
Dee BuddahMonk, I biaruola? Kaa, were oche.

"Ohia na uzo amarala" - ya bunu na yabu ihe doro onye obula anya.

"Ewu eriela m igu n'isi" - ya bunu ihe di egwu n'ekwesighi ime mekwasiri madu.

"Ivie aji n'ukwu" - nke a bu okwu Aro Okigbo. O putara ime madu obi isi ike.

"Eze onye agwala m" - aha ana-akpo onye na-esikari onwu.

"Anyi ama eve egbe?" - Nke bu kwa okwu Aro Okigbo. O di ka iju madu "kedu ka m ga-esi eru ebe ahu ngwa ngwa?"
Re: Akpaala Okwu (idioms). by Nobody: 10:39pm On May 07, 2015
Nkita aju okpukpu anyabara ya n'olu- (mmadu ifu ihe ona acho si na ya achoghizikwa)

Ewu ataa ya igu na isi (nnukwu ihe mberede emebido onye ahu)

onwu egbuoo ka aturu aka (ihe gara etu esi cho ya )

(1) (Reply)

The Gradual Phasing Out Of The Use Of Palm Wine For Traditional Wedding Rites / Abdulrasheed Akanbi, Oluwo Of Iwoland 'Stopped Rain' From Falling / Peremobowei Shedrack Erebulu Becomes The Youngest King In Ijaw Nation. Photos

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 23
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.