Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,160,464 members, 7,843,425 topics. Date: Wednesday, 29 May 2024 at 03:59 AM

Gịnị Mere Na Ndị Gọvanọ Anyi Anaghị Enwe Ịhụnanya Maka Ala Igbo? Ihe Anọha Ga-em - Politics - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Politics / Gịnị Mere Na Ndị Gọvanọ Anyi Anaghị Enwe Ịhụnanya Maka Ala Igbo? Ihe Anọha Ga-em (756 Views)

Rivers APC Reacts To Supreme Court Judgment, Calls It Mere Academic Exercise / Ihe Ise Dị Nnukwu Mkpa Mere Na Mpaghara Ụwa N’afọ 2017 / Ihe Ise Dị Ịtụnanya Mere Na Mpaghara Ụwa N’ọnwa Julaị...(sci.,medicine,politics) (2) (3) (4)

(1) (Reply) (Go Down)

Gịnị Mere Na Ndị Gọvanọ Anyi Anaghị Enwe Ịhụnanya Maka Ala Igbo? Ihe Anọha Ga-em by iKnowevents(m): 9:26am On Sep 02, 2017
African Language Time.

Hope the moderators here give permissions to discuss issues using our different native languages, it will fuel linguistics interest and pride in ones root.

Gịnị Mere Na Ndị Gọvanọ Ala Igbo Anaghị Enwekebe Ịhụnanya Maka Ala Igbo? Ihe Anọ Ha Kwesiri Ijikọ Aka Mee.

Izuụka a ihe abụọ batara m n’isi ide. Nke izizi bụ ọnọdụ ala Igbo nọ na ya, enweghị ike nke ndị gọvanọ anyị ijikọ aka ọnụ kwalite ma bulie ala Igbo elu, ọkachasị n’ihe gbasara ezi achụmnta ego, nnukwu ụlọọrụ, ezi okporo ụzọ na ezi ọchịchị wdg. Ihe ọzọ batakwaziri m n’isi bụ ịchaka EEDC nke Emeka Ọfọ nwe ji anyị eti n’ala Igbo. Ụgwọ ọkụ anyị na-akwụzi nọ ọdụ ka ọ bụ onyinye ka anyị na-enye ha maka ezi ọchịchịrị nke ha na-enye anyị kwa mgbe. Anaghị afọnye aka abụọ n’ọnụ, ya bụ ka anyị were otu, debe nke ọzọ maka echi.

 

Mgbe ọ bụla m si ala Igbo ga ihe dị ka Legọsụ mà ọ bụ Abuja, ihe na-agba m n’isi na-akarị akarị. Otu n’ime ha bụ ọtụtụ ndị Igbo bijuru ọkachasị na Legọsụ, na ijụ onwe m ihe kpatara nke a. Ụgbọala na-esi ala anyị aga Legọsụ kwa ụbọchị karịrị narị atọ, ụbọchị ọ bụla ego karịrị nde kwuru nde si ala anyị apụ maka isu ọhịa n’ala ọzọ, maka ịchọ ihe anyị kwesiri inwe n’ala anyị. Gịnị mere na ahịa ahụ anyị na-aga Legọsụ agbapụta, njem obodo oyibo anyị si Legọsụ apụ, visa anyị na-aga ịchọ na Legọsụ, ọtụtụ ihe ndị ọzọ anyị ga-apụrịrị n’ala anyị ga Legọsụ mà ọ bụ Abuja inwete, gịnị mere na ha abụghị ihe ndị anyị nwere ike inwete n’ala anyị na-ataghị ahụhụ ghaa ikpa asaa na mmiri asaa ịga weta ha? Ọ bụ iwu na anyị ga na-agbarịrị okporo ụzọ ihe karịrị awa asaa kwa mgbe tupu ọtụtụ ihe ndị a e ruo anyị aka? Anyị emeela ihe dị otu a ihe karịrị afọ iri isi, ndị gọvanọ nile anyị nwere ma ndị ochie, ndị omebe iwu ma nke ukwu na nta si ala Igbo, anaghị eche echiche maka ikwalite ala Igbo n’ozuzu oke ya. Ha nile na-agba mbọ nanị maka akpa ha, ebe ọtụtụ n’ime ha na-agba mbọ nke ukwu iji gosi na ha hụrụ Naijiria n’anya karịa ala Igbo(omume ndị e meriri n’agha na-achọ nnabata) ma chefuzie na ogoli na-esi n’ụlọ mara mma we pụta ezi. Gịnị mere na ndi gọvanọ ochie steeti ise anyị nwere ebighị n’ala Igbo ugbu a? Nke chịsịa, o kwanaa Abuja mà ọ bụ Legọsụ, ụfọdụ n’ime ha ụmụ ha amaghị ama nna ha. Nleta ka ha na-eleta ala Igbo, ihe ndị ọzọ ahụ ha debere n’obodo ndị ọzọ na-echu ha ụra, kedu otu mkpụrụ ihe gbochiri ha iwebata ha nile n’obodo ha chịrị na ya? Ntutu isi ha aga-efopucha na ha weta nnukwu ụlọ ọrụ nke ọtụtụ n’ime ha ji ego steeti we kwalite n’ala Igbo? I gụkọọ akụnụba ha na ụlọ ọrụ ha nwere n’ala Igbo na nke ha nwere n’obodo ndị ọzọ, i ga-achọpụta na nke ha nwere ebe a bụ ka e wee sịkwa. Ihe ndị a bụ iji gosi enweghị ịhụnanya na mmadụ anaghị echepụrụ ala ya ezi echiche. Ndị nke na-achị ugbu a, chee aka ghọrọ otu ha ga-esi mee voom na ọchịchị ha gasịa.

http://www.odeniigbo.com/articles.php?id=326
Re: Gịnị Mere Na Ndị Gọvanọ Anyi Anaghị Enwe Ịhụnanya Maka Ala Igbo? Ihe Anọha Ga-em by iKnowevents(m): 9:29am On Sep 02, 2017
Ka m jụkwa, o nwere ihe gbochiri ndị Igbo ikwalite ma dozie ala Igbo na Naijiria? O nwere iwu machiri ndị gọvanọ ala Igbo ijikọ aka ọnụ, wepụta atụmatụ tinye ya n’eserese, ihe nile ha chọrọ ka ọ gazie n’ala Igbo, tinye oge ma wepụta obi ha ihụ na ọ mịtara mkpụrụ? Ndị Awụsa jikọrọ aka ọnụ kwuo na ọ bụ ọchịchị ka ha chọrọ, nnukwu ọrụ gọọmenti nile dị n’Abuja, na ọrụ kakị nile, wee ruo ugbu a ọchịchị obodo a dị ha n’aka, ma ha ewepụtara onye isi obodo ma ha ewepụtaghị ya, onye ọbụla na-eku ha ka akwa. Ndị Yoruba e foro ntutu taa, kwuo na kama ihe dị na Legọsụ ga-abata ala anyị, ka nke anyị nwere bata Legọsụ. Obasanjo kaba ahụ mee ka steeti ya bụrụ isi obodo ọtụtụ ụlọọrụ site n’ime ka ọ dị mfe iwebata gasị maka nnukwu ụlọọrụ ọbụla tinyere isi ebe ahụ, ha si otu a jide ego karịa ma ndị na-amịpụta mmanụ, wee ruo ugbu a anyị na-echu obodo ha ka mmiri. Nanị ihe ndị ọchịchị ala Igbo dị mma ya bụ i na-eti “Wan Naijiria” ya na igosi ndị Awụsa na ha ka hụ ha n’anya karịa ndị Igbo bụ ụmụnne ha, ga jụọ ese. Kedu ihe anyị ga-eji n’aka ugbu a kwuo na ọ bụ “Igbo Ajenda” n‘abụghị ndị ọchịchị anyị ihulata ala debe isi ka e bo ha ibu arụ Naijria. Abụmonye Igbo anaghị enye ha ngala. Gbagaam oge eruola mgbe anyị ga-ejikọ aka ọnụ kwalite ala Igbo, ihe ahụ anyị na-achọ n’uko elu, ka anyị hulata ala nwete ya n’uko ala. Oge eruola mgbe anyị ga-ewepụ olileanya anyị na gọọmenti etiti, anyị a ga-eche ha ruo afọ narị abụọ? Ndị gọvanọ anyị na ndị ọchịchị ga-etinye anya na mmiri mee ihe ndị a, na ọbụrụkwa na ike ọrụ ga-adịnwu ha.

www.odeniigbo.com
Re: Gịnị Mere Na Ndị Gọvanọ Anyi Anaghị Enwe Ịhụnanya Maka Ala Igbo? Ihe Anọha Ga-em by cheruv: 9:29am On Sep 02, 2017
Supu!! grin

1 Like

Re: Gịnị Mere Na Ndị Gọvanọ Anyi Anaghị Enwe Ịhụnanya Maka Ala Igbo? Ihe Anọha Ga-em by iKnowevents(m): 9:30am On Sep 02, 2017
1. Ikpocha Ọbụala Nke Oshimiri Naịja.

Nke a bụ ihe gọọmenti nile chigolu Naijiria ji eto ndị Igbo akpịrị, ịpụta ihe ya nwere ike ịbụ na afọ narị atọ na anyị chebe gọọmenti etiti. Ha nile ma uru ikpochasị aja oshimiri Naịja dị nyere ala Igbo, o ga-eme ka anyị chakee. Ma ruo ugbu a, ihe yiri shovel abanyebeghị ebe ahụ iji mee ka nke ahụ nwee isi. Kemgbe ihe karịrị afọ iri atọ, nanị okwu maka ya ka a ka na-ekwu. O na-agba anya mmiri na ndị nile chịrị ala Igbo ma mkpa nke a dị, ma mee ihu na anya ka a aga-asị na ọ baghị uru. Ihe dị na ya ga-eri NNUKWU ego, mana ya bụ ọrụ ga-abụ ori anyụ, ihe ọbụla o riri ọ ga-agbọpụta ya afọ ole ma ole ma arụsịa ya. Gọọmenti etiti agaghị eme ka o nwee isi, ndị ụlọ omebe iwu ọkachasị ndị si n’ọdịda anyanwụ achọghịdị iji ntị ha anụ ya.

 

Oge eruola mgbe steeti ise dị n’ala Igbo ga-ejikọ aka ọnụ, chọọ nnukwu ụlọọrụ na-ahụ maka ikpocha na ịrụ ebe ọdọ ụgbọmmiri, ha nile ebinye aka, nwee ezi nkwekọrịta nke ga-abara anyị uru maka ikpochasị aja dị n’ala oshimiri Naịja. E kpochasịa ya bụ ebe, gọọmenti ala Igbo ga-eji ezigbo atụmatụ labata ndi Igbo nwere ụgbọ na-ebubata ibu ka ha tinyebe isi ebe ahụ. Ụzọ atọ n’ụzọ iri na-ebubata ahịa na Legọsụ tinye isi ebe ahụ, mmanwụ ga-agba n’ala Igbo. E mee nke a ihe ruru otu afọ, ọbụghị n’akwụkwọ ka anyị ga-agụtaba uru ọ bara, onye isi ga-ahụ ya. Gụọ maka ụzọ mmiri (canal) nke Panama na Suez, arụrụ ha abụọ tupu o nwee ihe dị ka Naijiria, e mee ihe dị otu ahụ na steeti Imo màọbụ na Abịa, uru ya ga-adigide ụwatụwa.

www.odeniigbo.com
Re: Gịnị Mere Na Ndị Gọvanọ Anyi Anaghị Enwe Ịhụnanya Maka Ala Igbo? Ihe Anọha Ga-em by iKnowevents(m): 9:34am On Sep 02, 2017
2. Ikwalite Ọdụ Ụgbọ Elu Nke Enugwu, Imo Na Nke Anyị Na-Ele Anya Ya n’Anambra.

Anyị ma mgba ọtụtụ gbara iji gbochi ime ọdụ ụgbọelu nke Enugwu ka ọ bụrụ maka ịga mba ofeesi. Anyị makwazi na ọ bụ otu ọnwa ka eji mee nke Kaduna ka o ruo ogo iji na-anabata ụgbọelu obodo oyibo n’afọ a. Chee echiche maka nke a. Mbọ nile a gbara maka nke Enugwu dị ka ọ nara n’iyi n’ihu ndị ọchịchị ndị Igbo? O nwere ihe e mere anyị n’anya? Kedu ihe mere na we ruo ugbu a anyị etibeghị ebe ahụ ka mmanwụ Ijere, kụọ ekwe mee ka ndị nile si ala Igbo agbaga Legọsụ maka ịba ụgbọelu bido were nke ahụ kpọba ihe? Gịnị mere na wee ruo ugbu a na ọ bụ nanị ụlọọrụ njem ụgbọelu abụọ na-arụ ọrụ ebe ahụ? Ọ dị anyị ka o na-enweghị ihe a ga-eme ka ọtụtụ chube ebe ahụ ka mmiri? Ka ọ bụ na odoghị anyị anya ụmị ego dị n’akwado ebe ahụ nke UKWU? Ọtụtụ na-esi Enugwu banye ụgbọala gaa Legọsụ ịba ụgbọelu, anyị e meela ebe ahụ ka o lekasịa ka akwa nwa mgbi. Anyị akpọọla ala Igbo komkom, ụmụaka ewere anyị sibe nri aja!

www.odeniigbo.com
Re: Gịnị Mere Na Ndị Gọvanọ Anyi Anaghị Enwe Ịhụnanya Maka Ala Igbo? Ihe Anọha Ga-em by iKnowevents(m): 9:36am On Sep 02, 2017
3. Ọkụ Eletrik.

Nanị ihe abụọ ka EEDC dị mma ya, ịnakọ ụgwọ ọkụ ma ọkụ adị ma ọdịghị, ya na ihụ na ọchịchịrị gbachiri ebe nile kwa mgbe. NEPA ka ha mma ugbu a. Ọtụtụ ụlọọrụ ma nke ukwu ma nke nta emechisiela, maka mbọ ndị EEDC na-agba. Amaghị m na ndị gọvanọ anyị ama maka ahụhụ nke ya bụ ụlọọrụ na-ewetara anyị n’ala Igbo a? Achọghị m ikwu maka wuru wuru chawapụtara ka anyanwụ tupu ha eweta ikikere ikesa ọkụ n’ala Igbo. Ndị gọvanọ anyị oge eruola mgbe ụnụ ga-esibe mmadụ mmadụ kwụsị isi mmụọ mmụọ ma chọwa ụzọ dị iche iche anyị ga-esi wee merie ike ọchịchịrị n’ala anyị a, ọkụ dịba, nke ọma, onye ngwọrọ ga-agba egwu n’ala a, ọtụtụ aka ọrụ ga-achawapụta. Atụmatụ ewepụtara maka ọkụ ịdị kwadaa n’ahịa Arịarịa dị mma, ka anyị nyocha ya ma webata ya n’ọtụtụ ebe ọkachasị ebe nwere ọtụtụ nnukwu ụlọọrụ. Ihe aga-eme maka ikwalite ọnọdụ inwebe ọkụ karịrị akarị, ihe ọ fọdụrụ bụ ibido mebe ha.

 www.odeniigbo.com

1 Like

Re: Gịnị Mere Na Ndị Gọvanọ Anyi Anaghị Enwe Ịhụnanya Maka Ala Igbo? Ihe Anọha Ga-em by iKnowevents(m): 9:41am On Sep 02, 2017
4. Briten, Amerịkà Na Chaina Inwe Ngalaba Embasi Ha N’ala Igbo(Consulate).

E kee ihe nile nọ na ahịa ‘Main Market” ụzọ abụọ, otu ụzọ atụọla ụkwụ na Chaina, otu ụzọ n’ụzọ ise na-echu ya ka mmiri maka ibute ahịa ha. I gaa n‘ụlọọrụ ebe nnochite anya ndị Amerịkà na Briten dị na Legọsụ, ụzọ atọ n’ụzọ iri na-achọ visa ebe ahụ bụ ndị Igbo. Anyị na-agafe ikpa asaa na mmiri n’asaa na anyị na-aga Legọsụ màọbụ Abuja ịga weta visa ndị a. Legọsụ dịrị ndị ọdịda anyanwụ nke Naijiria nso, Abuja dịịrị ndị mgbagọ ugwu nso, ebe anyị nwere ọtụtụ ndị si n’ala Igbo aga obodo ndị a, o ruru anyị ịgba mbọ ime ka ha nwee ngalaba ha n’ala Igbo. Amaghị m ihe kpatara na anyị anụbeghị nkata maka nke a? Ndị gọvanọ ise anyị nwere kpọọ nke a ihe, ma sòchie ya n’ọkụ n’ọkụ, ụmụnnaa anyị ga-ahụ na onweghị ihe nyịrị omume! Steeti Enugwu pụrụ inabata ha atọ, ha nwekwuru ọdụ ụgbọelu na-aga obodo oyibo. Kedu ihe anyị na-eche kemgbe afọ iri isii gara aga? Onye ọbụla ekọnọmi doro anya ma NNUKWU  mkpa na NNUKWU ihe ụdị ihe a ga-ebute n’ala Igbo.

 www.odeniigbo.com

1 Like

Re: Gịnị Mere Na Ndị Gọvanọ Anyi Anaghị Enwe Ịhụnanya Maka Ala Igbo? Ihe Anọha Ga-em by iKnowevents(m): 9:44am On Sep 02, 2017
Na ngwụsị, ihe aga-eme eme karịrị akarị, mana ọsọ enweghị mbido anaghị enwe ọgwụgwụ. Ihe dị n’ala steeti Ebonyi na-eche anyị bụ aja dị n’ala, na ha na-akọpụta nri abụghị akụkọ, osikapa Abakaleke dịbara kemgbe ihe karịrị afọ atọ gara aga, keduzi ihe kpatara na kama ọ ga-agaba n’ihu, ọ bụrụla ihe ncheta? Nnukwu ụlọọrụ ama ama nwee ngalaba ha n’ala Igbo ọ bụ arụ? Ihe nile ndị a ịbata n’ala anyị bụ site na otu anyị si tụ okwe anyị. Ka anyị ga ala Jamani na Izrel mụta ihe na mmepe ha, Izrel i na-ahụ ugbu a bụ nnukwu ikpa ihe dịka afọ iri isii gara aga, obodo ahụ chakere maka na ndị na-achị achị nwere echiche mmadụ, nwee ike ihụ ihe ga-eme echi, nanị ihe ndị nke anyị na-ahụ bụ gbagam akaụnt ha ga-ada.

 

O nweghị ihe mmadụ chere echiche nke ọma ma bido nke anaghị enwe ngwụsị. Kedu ihe ga-egbochiri anyị inwete ezi ọganihu n’ala Igbo? Ụfọdụ ga-asị na gọọmenti etiti agaghị akwado ihe ndị a, ajụjụ m abụrụ kedu uru gọọmenti etiti baara anyị na ọ bụrụ na ha achọghị ọganihu anyị? Ego abụghị ya ji ọrụ n’ụdị ihe ndị a, maka na ndị ji ego achụ ego ma uru ha ga-erite na ha tụnye ego ha na ya. Ọ bụrụ na ndị gọvanọ anyị na ndị ọchịchị anyị enweghị ịhụnanya, ka anyị munye ya bụ ọkụ  n’ime ha. Ka nhọpụta ndị ọchịchị anyị ugbu a bido igbado ụkwụ na ndị hụrụ ala Igbo n’anya, ndị tụnyegolu ọtụtụ ihe n’ala Igbo, ndị ma uru dị n’ala anyị, ndị omume ha na-egosi agụụ idozi ala anyị. Oge agaala mgbe okwu dị mma nze a taa ọjị, okwu adịghị mma nze ataa ọjị.

 

Ka ozi a ruo ndị isi anyị aka.

 

 

Kwado asụsụ Igbo; kwado Odeniigbo

www.odeniigbo.com

1 Like

Re: Gịnị Mere Na Ndị Gọvanọ Anyi Anaghị Enwe Ịhụnanya Maka Ala Igbo? Ihe Anọha Ga-em by iKnowevents(m): 9:46am On Sep 02, 2017
Ya gaziere onye ukwu na onye nta!

Egbe bere, ugo bere...

2 Likes

Re: Gịnị Mere Na Ndị Gọvanọ Anyi Anaghị Enwe Ịhụnanya Maka Ala Igbo? Ihe Anọha Ga-em by momentusjay(f): 10:09am On Sep 02, 2017
Nwanem nwoke edemede nka maranma nke ukwuu. Na nghota nkem, ndi be anyi enweghi ihunanya na ime onwe ha. Nani ebe ihunanya di ga agamnilu na adi.

1 Like

Re: Gịnị Mere Na Ndị Gọvanọ Anyi Anaghị Enwe Ịhụnanya Maka Ala Igbo? Ihe Anọha Ga-em by iKnowevents(m): 10:38am On Sep 02, 2017
momentusjay:
Nwanem nwoke edemede nka maranma nke ukwuu. Na nghota nkem, ndi be anyi enweghi ihunanya na ime onwe ha. Nani ebe ihunanya di ga agamnilu na adi.

Daalu. Achobeghi m ikweta na anyị enweghị ịhụnanya maka onwe anyị. Ihunanya nwere ike idi, kama na anya ukwu na achom nke onwe ekweghi anyi jiko aka onu mee ihe itunanya maka odimma nke ala anyị.

(1) (Reply)

When Atiku And Others Retwit Your Reply / Why Buhari Belongs To Only Katsina – Ezeife / I Want Senator Dino Melaye Name Be Remembered In Every Home In Nigeria Forever

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 48
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.