Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,158,134 members, 7,835,805 topics. Date: Tuesday, 21 May 2024 at 03:14 PM

Ihe Ise Dị Ịtụnanya Mere Na Mpaghara Ụwa N’ọnwa Julaị...(sci.,medicine,politics) - Politics - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Politics / Ihe Ise Dị Ịtụnanya Mere Na Mpaghara Ụwa N’ọnwa Julaị...(sci.,medicine,politics) (1070 Views)

Rivers APC Reacts To Supreme Court Judgment, Calls It Mere Academic Exercise / Ihe Ise Dị Nnukwu Mkpa Mere Na Mpaghara Ụwa N’afọ 2017 / Gịnị Mere Na Ndị Gọvanọ Anyi Anaghị Enwe Ịhụnanya Maka Ala Igbo? Ihe Anọha Ga-em (2) (3) (4)

(1) (Reply) (Go Down)

Ihe Ise Dị Ịtụnanya Mere Na Mpaghara Ụwa N’ọnwa Julaị...(sci.,medicine,politics) by myklangelo(m): 9:25pm On Aug 03, 2017
MODS, please do not delete as usual. I think it is high time we start promoting our different native languages using all necessary platform especially online. Nairaland is big enough to contain the linguistics diversity. Thanks, nothing here is in any minute way tribalistic, rather it is a brief summary of all the major global happenings last month, in the Igbo language. Welcome

1. Mba Poland Chọrọ Isi N’ọchịchị Onye Kwuo Uche Ya Banye Na Nke Ọchịchị Aka Ike

Ebe anyị kwesiri ina-anụ ụdị akụkọ a bụ na mba Afrika mà ọ bụ na nke ndị Arab, o nwere otu o si ada na ntị na ọ bụrụ ihe anyị ga na-anụ maka obodo dị na Yurop. Mana nke ahụ bụ otu o si gbata kwụrụ na Poland ugbu a. Nke a bụ kemgbe otu pati nke na-achọ igbanwe ọchịchị ala Poland weghaara ọchịchị. Onye isi obodo ahụ na-ewebata atụmatụ nke ga-eme ka ike nile dịrị n’aka otu pati ya ahụ. Otu ihe ha mere bụ ime ka ọ bụrụ nanị n’aka pati ha ka nhọpụta ndị ọka ikpe nke ụlọ ikpe ukwu nke obodo ahụ dị n’aka.

Ihe ọzọ ha mekwaziri bụ na ha tinyere ike nhọpụta ndị ọchịchị dị iche iche ka ọ dịrị n’aka pati nke onye isi obodo. Ya bụ ndị nile ga na-ahụ maka nhọpụta, ibinye aka votu, na otu nhọpụta ndị ọchịchị ga na-esi aga dị n’aka otu pati ahụ. Ha gakwara n’ihu tinye ike imepụta iwu ọhụrụ nke karịrị iwu ji obodo n’aka onye isi obodo ahụ. Ya bụ, kama a ga na-eso ihe dị n’akwụkwọ iwu, onye isi obodo nwere ike karịrị ya bụ akwụkwọ iwu, o nwere ike imebe iwu ọ bụla masịrị ya. Ha gakwara n’ihu chọọ ụzọ a ga-esi mee ka ụlọ ọrụ mgbasa ozi nile dịrị n’aka otu pati ahụ ji ọchịchị.
Ka ihe nile a na-eme, ndị obodo a gbachịrị nkịtị? Mba, kemgbe otu ọnwa ka ndị obodo nile nọ na ngagharị iwe. Ihe ruru mmadụ puku iri ise nọ n’isi obodo ugbu a maka ya bụ ngagharị iwe, rụọ ebe obibi gbanye mkpọrọgwụ na ha agaghị apụ ganye n’obodo ha agachigha azụ n’ọchịchị onye kwuo uche ya n’abụghị obodo ha ịnọ n’aka nanị otu pati. Ka anyị na-ele anya mara ihe ya bụ okwu ga-apụta.

Source: www.odeniigbo.com

1 Like

Re: Ihe Ise Dị Ịtụnanya Mere Na Mpaghara Ụwa N’ọnwa Julaị...(sci.,medicine,politics) by myklangelo(m): 9:27pm On Aug 03, 2017
2. Anyị Chọpụtara Na Maz (Mars) Enweghị Ndụ Ọ Bụla N’ime Ya

Kemgbe ihe karịrị afọ iri atọ ka mmadụ nwere olileanya na ndụ dị na ụwa Maz, ọtụtụ ndị nnyocha e kwuọla na oge n’adịghị anya na mmadụ ga-arụ ebe obibi ma nwee ike ibi na ya bụ ụwa. Mana n’ọnwa Julaị ka nchọpụta pụrụ iche gosiri na nke ahụ abụghị ezie.

O nwere ihe dị ka mmiri nke jupụtara n’ụwa ahụ nke mmadụ chere na ihe ọ pụtara bụ na ndụ nọ ebe ahụ, ka e mechara nyocha na mbido ọnwa Julaị, ka a chọpụtara na ya bụ ihe dị ka mmiri jupụtara na kemikal a na-akpọ “Perchlorates” . Ya bụ kemikal ihe eji wee mara ya bụ na ọ dị nnukwu ike n’igbu ihe ọ bụla di ka ndụ. O nweghị ihe ọ bụla na-adị ndụ ebe ọ bụla ahụrụ ya. N’ụwa nke Maz o juru n’elu ya nile etu ahụ aja si jupụta n’elu ụwa nke anyị. Ya bụ, na mmadụ ibi n’ụwa ọzọ karịa ụwa nke anyị ugbu a, ka tere nnukwu aka, nchọpụta nke a weghachiri aka elekere azụ. Anyị ka na-ele anya n’ọnwa.

www.odeniigbo.com

1 Like

Re: Ihe Ise Dị Ịtụnanya Mere Na Mpaghara Ụwa N’ọnwa Julaị...(sci.,medicine,politics) by myklangelo(m): 9:30pm On Aug 03, 2017
3. Obodo Nọt Koria Rụrụ Ogbunigwe Nwere Ike Isi N’obodo Ha Ruo Amerịkà

Mgbe ọ bụla anyị kwuru maka mba Nọt Koria, o doro ewu na ọkụkọ anya na o nweghị ezigbo ihe a na-ekwu maka ya bụ obodo. Nke a bụ maka na onye ọchịchị ya bụ ebe na-eme ka nwata ọgụ na-agụsi ike karịa nri. Mbido ọnwa Julaị ka ha gosiri na ọ bụghị nanị ọnụ okwu ka ha nwere kama na ike ọgụ dikwaazi ha. Ha nwalere ogbunigwe nwere ike isi na be ha ruo Rọchịa, Ọstrelia, Kanada, na Amerịkà. Ogbunigwe ọ bụla si mba ọ bụla ruo Amerịkà, na-akpa nwa agụ aka n’ọdụ. Anyị makwazi ụdị mmadụ na-achị Amerịkà ugbu a.

Ka ha mechara ya bụ nwalee, ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n’okwu gbasara ogbunigwe na-agate aka na-ekwu na ya bụ nwalee ndị Nọt Koria mere enyeghị ha n’ezie ihe ha chọrọ. Ha na-ekwu na ogbunigwe ahụ enweghị ike ilaghachite n’ime ụwa na-agbapụ ya n’elu igwe. Ụfọdụ na-ekwu na mgbe o ruru ebe atụrụ ya na o nweghị ike ịrụ ọrụ ya dị ka ogbunigwe nke a bụ maka na teknụzụ ndị obodo ahụ erubeghị ime nke a.

Ihe egwu n’ihe nile a bụ na anyị amaghị nke bụ eziokwu n’ikpeazụ. Ndị Nọt Koria rụpụta ụdịrị ogbunigwe ahụ, mara amara na agwọ nọ n’akịrịka, ajọ agwọ. Ndị Nọt Koria mechara mekwa nwalee ọzọ, nke gosipụtara na ogbunigwe ha ga-erunwu Wọshintin na Niu Yọk nke Amerịkà...

www.odeniigbo.com

3 Likes

Re: Ihe Ise Dị Ịtụnanya Mere Na Mpaghara Ụwa N’ọnwa Julaị...(sci.,medicine,politics) by myklangelo(m): 9:31pm On Aug 03, 2017
4. WHO Chọpụtara Ọrịa Nke Esi Na Mmekọrịta Nwoke Na Nwanyị Ebute, Nke Ọgwụ Ọ Bụla Enweghị Ike Na Ya.

Ọrịa ọgwụ mgbochi enweghị ike n’ebe ha nọ bụ nnukwu ajọ ihe chere anyị n’ihu n’ụwa kịta. N’ọdị nso a, a chọpụtara ụfọdụ ihe na-ebute ọrịa nke enweghị ọgwụ ọ bụla nwere ike n’ebe ha nọ, ka a ka na-ekwu, ụzọ anyị si arụpụta ma gwọkọ ọgwụ mgbochi njepeka (antibiotics) eruola n’isi njedebe. Nke a pụtara na ụdịrị ngwọtọ ọgwụ mgbochi njepeka enwere ike ime, na anyị eruola n’isi mmiri maka ya ugbu a. N’izuụka gara aga ndị WHO wụnyere mmanụ n’ọkụ na-agba ụlọ site na ịma ọkwa gbasara ụdịrị ọrịa gonoria pụtara ọhụrụ.

Gonoria ọhụrụ a, siri nnukwu ike karịa nke anyị nwere na mbụ. O nweghị ọgwụ ọ bụla dị n’ụwa ugbu a nwere tụmadị otu mkpụrụ ike n’ebe ọ nọ. Abịakwuzie nwa ọhụrụ ka nọ n’afọ na-ebute ya site na nne ya bụ ya bụ ọrịa. A hụla ya bụ ọrịa n’ọtụtụ obodo gụnyere, Frans, Japan, Spen wdg.

Ihe ụjọ dị na nchọpụta a bụ na ndị WHO kwuru na nke ahụ dị ka obere ihe na nchọpụta ọhụrụ ha na-enweta ugbu a. Ha na-ekwu na o nwere ike inwe ọrịa ọhụrụ ga-abata nke bụ dike na agha, ma bụrụkwazie nke esi na mmekọ nwoke na nwanyị ebute. Oge eruola mgbe mmadụ ga-akwa onwe ya nga, ị lụta nwanyị mara nanị sọ nwunye gị, o nweghị onye ma ọrịa ọhụrụ na efegharị ugbu a.

www.odeniigbo.com

2 Likes

Re: Ihe Ise Dị Ịtụnanya Mere Na Mpaghara Ụwa N’ọnwa Julaị...(sci.,medicine,politics) by myklangelo(m): 9:34pm On Aug 03, 2017
5. Mba Amerịkà Kwuru Na Oge Okwu Agaala Na Ugbu A Bụzi Oge Ọgụ Nyere Ndị Nọt Koria Na Ndị Na-Akwado Ha.

Nọt Koria bụ obodo nke ihe nile gbasara ya dị n’aka otu onye, Kim Jong. Otu onye ahụ bụkwazi onye omume ya ọtụtụ mgbe bụ nke na-adị ka nke onye nwetụrụ nsogbu, ị ga-amata nke a site n’ọtụtụ iwu o wepụtara na-achị obodo ya, otu o si egbufu onye ọ bụla ọ dị ya ka ọ bụ onye iro ya, na omume ‘ezeonyeagwalam’ jupụtara ya ahụ. Anyị dere maka ogbunigwe nke ọ rụpụtara ma nwalee na mbido ọnwa Julaị, okwu ọ bụla nwere ọsịsa, ugbu a onye isi obodo mba Amerịkà enyela ya ọsịsa.

Trump na ngwụsị ọnwa Julaị, mere ka anyị mara na ọ dị nkwadobe ikpochapụ obodo Nọt Koria, ma wepụta ntaramahụhụ nye obodo ndị na-akwado ya. O mere ka ndị UN mata na oge okwu agaala n’ihe gbasara otu a ga-esi wee meso Nọt Koria omume. O kwuru na nanị ihe ya bụ onye ọchịchị obodo ahụ ga-anụ ugbu a bụ agha. Iji gosi nkwado Amerịkà dị maka nke a, ha na ndị Japan na Saut Koria ejikola aka ọnụ inwalee ike ha maka agha na-abịanụ. Ndị agha ha na-eme ihe omụmụ dị iche gasị ugbu a iji gosi nkwadobe ha dị ịza oku agha ọ bụla nke ndị Nọt Koria ga-akpọ ha.

Ndị agha nke ụgbọ elu Amerịkà na Japan na-efegharị n’akụkụ obodo Nọt Koria, ha kwukwaziri na ha dị nkwadobe ịtụ ogbunigwe n’akụkụ obodo ahụ ebe masịrị ha. Ihe eji ejide ogbunigwe agbapụrụ n’ikuku nke ndị mba Amerịkà dikwaazi nkwadobe imebisi ogbunigwe ọ bụla nke si na mba Nọt Koria. Ha anwalela ngwa ọgụ ahụ ma hụ na ha zuru ka e mee na ngwụsị ọnwa Julaị. Ha kwukwaziri na ha dị nkwadobe ime ihe ọ bụla iji gbochie mba Chaina inyere mba Nọt Koria aka.

Ọ gwụkwana ka ọ ha m n’ọnụ. Ka anyị cheta ụwa nile n’ekpere anyị ọ kachasị ihe ga-ebute agha na oke ụnwụ. Chetakwazie Naijiria.


Kwado asụsụ Igbo; kwado Odeniigbo

www.odeniigbo.com

3 Likes

Re: Ihe Ise Dị Ịtụnanya Mere Na Mpaghara Ụwa N’ọnwa Julaị...(sci.,medicine,politics) by Onyegecha(f): 9:34pm On Aug 03, 2017
i gbaliala jiri Igbo deputa ihe ndia di itunanya. jisike

4 Likes

Re: Ihe Ise Dị Ịtụnanya Mere Na Mpaghara Ụwa N’ọnwa Julaị...(sci.,medicine,politics) by ALOWONLE419(m): 9:42pm On Aug 03, 2017
grin
Re: Ihe Ise Dị Ịtụnanya Mere Na Mpaghara Ụwa N’ọnwa Julaị...(sci.,medicine,politics) by goodmorning40: 9:44pm On Aug 03, 2017
Odikwa troubleoo
Olee otu mga eji guchaa ederede nke a nile
Biko anaghim agu joo

1 Like

Re: Ihe Ise Dị Ịtụnanya Mere Na Mpaghara Ụwa N’ọnwa Julaị...(sci.,medicine,politics) by mazimee(m): 9:45pm On Aug 03, 2017
Nwanna imere nke oma, O tee la aka m guru edemede Igbo. Di si Ike

4 Likes

Re: Ihe Ise Dị Ịtụnanya Mere Na Mpaghara Ụwa N’ọnwa Julaị...(sci.,medicine,politics) by mazimee(m): 9:46pm On Aug 03, 2017
ALOWONLE419:
grin
Eze ure nwuru anwu

1 Like

Re: Ihe Ise Dị Ịtụnanya Mere Na Mpaghara Ụwa N’ọnwa Julaị...(sci.,medicine,politics) by ESDKING: 9:48pm On Aug 03, 2017
Nezi okwu, ederede gi a karikwaru akari .
Re: Ihe Ise Dị Ịtụnanya Mere Na Mpaghara Ụwa N’ọnwa Julaị...(sci.,medicine,politics) by BAILMONEY: 9:57pm On Aug 03, 2017
mazimee:


Eze ure nwuru anwu
NWANNE OKWAM KA INA AKPO EZE UREgrin AHA AHU BU AHA MU JI ETINYERE NDI OFE MME MME NSOGBUgrin

1 Like

Re: Ihe Ise Dị Ịtụnanya Mere Na Mpaghara Ụwa N’ọnwa Julaị...(sci.,medicine,politics) by kid23(m): 9:58pm On Aug 03, 2017
Jisie Ike Igbo Amaka

2 Likes

Re: Ihe Ise Dị Ịtụnanya Mere Na Mpaghara Ụwa N’ọnwa Julaị...(sci.,medicine,politics) by DeeMain(m): 10:32pm On Aug 03, 2017
Edemede gi a atogbuola m. O di kajad!! Jidekaiji!!!

1 Like

Re: Ihe Ise Dị Ịtụnanya Mere Na Mpaghara Ụwa N’ọnwa Julaị...(sci.,medicine,politics) by Pharaoh9(m): 2:00am On Aug 04, 2017
Nwanne m, imela na-itunye anyi ihe na-eme na mpagara Uwa a, Obi di m uto na m guchara ma ghotakwa edemede a nile, Udo diri gi.

1 Like

Re: Ihe Ise Dị Ịtụnanya Mere Na Mpaghara Ụwa N’ọnwa Julaị...(sci.,medicine,politics) by mazimee(m): 6:23am On Aug 04, 2017
BAILMONEY:
NWANNE OKWAM KA INA AKPO EZE UREgrin AHA AHU BU AHA MU JI ETINYERE NDI OFE MME MME NSOGBUgrin


Gbahara m Nwanna, m chere n' O bu ndi ofe
Re: Ihe Ise Dị Ịtụnanya Mere Na Mpaghara Ụwa N’ọnwa Julaị...(sci.,medicine,politics) by EmeeNaka: 7:23am On Aug 04, 2017
Ogwusigo Ihe mere na mpaghara uwa na onwa July?
Etu ma etu osinadi, I mere nke oma.
Ya gazie!

1 Like

Re: Ihe Ise Dị Ịtụnanya Mere Na Mpaghara Ụwa N’ọnwa Julaị...(sci.,medicine,politics) by Cornerstone2020(m): 7:44am On Aug 04, 2017
ntuputa gi di nma. igbo bu igbo ka anyi nyere OP aka n' ikwado asusu igbo.

1 Like

(1) (Reply)

No Jokes Please...where Is This NNAMDI KANU Now??? / Police Unmask Masterminds Of Ozubulu Church Killings / It Is Definitely NOT TRUE That We Built A Website For N700mn.

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 28
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.