Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,161,995 members, 7,849,001 topics. Date: Monday, 03 June 2024 at 01:16 PM

Igbos come show your proverbs skills - Culture (22) - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / Igbos come show your proverbs skills (279369 Views)

Nigeria Pidgin Proverbs & Their Meanings / Igbos come show your proverbs skills - (Part 2) / Yorubás come show your proverbs skills (2) (3) (4)

(1) (2) (3) ... (19) (20) (21) (22) (23) (24) (25) ... (101) (Reply) (Go Down)

Re: Igbos come show your proverbs skills by faketan(m): 7:28pm On Sep 07, 2007
@echelon. . . iseeee

Ome mma na mma yi ana, ome njo na yi ana, ikwu amaghi ibe ezi ya nke onye metara o buru.

Di ka m si kwu na mbu, na egbe nkanka nku abughizi nwata egbe.

Itapia ilu igbo n' oyibo na-ewepu uto ya. iwere anya okeny lee ya i mata amaghi etu a ga-sei kworo onye ukwu wara.

Ogaghi ekwe m omume. Daalu maka inabata m etu m siri di.

Okwa ihe di be oke di be ogini, okwanu oke no n'ulo gwara oke no n'ohia na azu di na ngiga.
Re: Igbos come show your proverbs skills by echelon(m): 7:54pm On Sep 07, 2007
Ndi be anyi na-atu ilu si na,

Onu akoro mmadu bu chi ya ka akoro ya
Insults to a person also goes to his God

Ife di onye mkpa ka o na-ekwu
Everyone says what is important to him/her

Uche ofu onye anaghi ezucha
One person's wisdom is not always enough
Re: Igbos come show your proverbs skills by faketan(m): 10:00pm On Sep 07, 2007
Iseeeeeeeeeeee
Re: Igbos come show your proverbs skills by echelon(m): 1:02am On Sep 08, 2007
Ndi be anyi na-atu n'ilu si na

Onye wetalu oji, wetalu ndu
He who brings kolanut, brings life

Onye riri anu udene erigo ajo nri
He who eats the vulture's meat has eaten a bad food

Oje na nwayo anaghi emeru aru
He who takes it easy does not get injured

but sometimes you've gotta take it hard sha
Re: Igbos come show your proverbs skills by faketan(m): 1:12am On Sep 08, 2007
Onye na-eri awo ya rie nke gbara agba nke oga-abu akpoo ya ori awo ya aza. maka na onye na-amaghi ebe mmiri bidoro mawa ya apughi i matakwa ebe okwusiri ima ya. Ana agwa Ochi nti na-agha esula. Mbanunu, agha akara aka adighi eri ngwuro. Maka na ekwe kuo ama agba. Anu gbana taa echi bu nta. mbosi nta ka chia na owere nchi.
Onye si na ndi Igbo agaghi adi, ya bukwara okuko uzo lakpuo ura.
Ka chi foo
Re: Igbos come show your proverbs skills by echelon(m): 1:27am On Sep 08, 2007
@faketan

Ka chi boo

Igbo bu Igbo ka I bu
Re: Igbos come show your proverbs skills by lovemajek(f): 2:06am On Sep 08, 2007
we want proverbs,
Re: Igbos come show your proverbs skills by echelon(m): 2:18am On Sep 08, 2007
@lovemajek

Ka o di echi (till 2moro) grin
Re: Igbos come show your proverbs skills by lovemajek(f): 2:19am On Sep 08, 2007
car see phone.
Re: Igbos come show your proverbs skills by faketan(m): 11:58am On Sep 08, 2007
Lovemajek, onye kworo ka ilu igbo si ato, otabiri aka. Ebe onye oso ruru ka onye ije ga-eru, mgbada gbala ihu echi bu nta. Oke n'ohi ngwere n'uzo, anyi ncha bu ofu. . . .Onye lee ka ozu dewere ihu, o begbue onwe ya na akwa. . . .Ukwa rue oge ya o daa. onye huru ukwa di n'elu, o were osis dutue ya, ogaghi aka aka wee daa, mgbe ahu chi ojo ariwa ibe ya elu.
Re: Igbos come show your proverbs skills by echelon(m): 12:09pm On Sep 08, 2007
Ndi nwe m na ndi m nwe mma mma nuoo

A na asi na

Onye ajuju anaghi efu uzo
The inquisitive person never misses his/her way

Achusia aja ma ahughi udene, i mara na ihe mere n'ala ndi moo
If after sacrifices the vulture is not seen, know that something happened in the land of the spirits

Ndi be anyi na-asikwa na

Onye kwe n'ihe otu kwuru, O laa n'oge
Anyone that agrees to what the "Otu" (Onitsha main market) prices, will go home on time

Noro nu juu
Re: Igbos come show your proverbs skills by echelon(m): 2:05pm On Sep 08, 2007
Ndi be anyi na-asi na

Onye were ngongo nua iyi, iyi ewere ngongo gbuo ya
He that drinks the "iyi"please translate with abandon, the "iyi" will kill him with abandon too. o di kwa ka ihe faketan na-ekwu bu eziokwu

Aku bu ilo
Wealth brings Envy/Enemies

Ogologo ndu na eziokwu yi aga
Long life goes with truth
Re: Igbos come show your proverbs skills by faketan(m): 4:16pm On Sep 08, 2007
Nna Mbe si na ejighi ehi akwa nne di na nso ma asikwanu ya weta ya bu ehi, ya enweghi ya.

Agwo omeghi ihe ojiri buru agwo umu azi ewere ya kee nku. . . Okenye adighi ano n,ulo, ewu amuo n'ogbiri. Obu ihe ojoo I so mmuo gbuo mmadu soro ndi mmadu bia akwam ozu.

Egbuo dike na ogu ulo, erue na ogu ama elote ya.

Nke onye na-eme ya gaziere yaoo
Re: Igbos come show your proverbs skills by echelon(m): 1:27am On Sep 09, 2007
Ndi Igbo si na

Ukwu okuko zoro nwa ya anaghi egbu ya
The stepping-on on a chick by its mum does not kill it

Ebe onye no ka chi ya no
Where a person is, his god is there too

Ebe onye bi ka o na-awachi
Where a person lives is where he maintains
Re: Igbos come show your proverbs skills by echelon(m): 3:33am On Sep 09, 2007
*clears throat* Mmadu anozikwa ebe a?

O di mma, a na-asi na

Gbara agbara rie ede, maka na ede bu oke mmuo!
Eat Cocoa yam with caution, because cocoa yam is a great spirit

Aturu makpuru n'ala makpu kwa na elu okpukpu ya.
The sheep that is lying on the ground is lying on its bones

Anyi we na-asikwa na

Ososo mmiri ji banye n'ime olulu, o gbajie ukwu
When the flood runs into a ditch, it brakes its legs

Nodunu juu ndi be anyi

@Faketan
M ga-acho ka i nwuru okwa n'aka wee bia ebe a echi o
Re: Igbos come show your proverbs skills by faketan(m): 10:05pm On Sep 09, 2007
Nze buna nwa abiala m choo gi eri ututu ma ahughi m ichere aki.

Okenekwa. Amara m ugwu muta mgbaji ukwu, agadi nwanyi amuta agakata akwuru. Nihi agadi nwanyi daa nda ada n'abo, agukoo ihe o bu n'ukpo onu. Okuko si na ihe ya ji anu mmiri ele anya nigwe bu na ihe na-egbu ya na-esi n'elu abia.

Okuko egbe buru siri na ihe ji etiri mkpu abighi ka ihe ji ya aka hapu ya aka, kama ka igwe nuru, kala nuru.

uhuruchi omanu ndi nze ibe m.
Re: Igbos come show your proverbs skills by echelon(m): 11:26am On Sep 10, 2007
Onye biri ka ibe ya biri, anokebeghi m n'ulo unyahu.

Ndi be anyi na-asi na

Uwa abu nke onye?
Who owns the world?

Nwanyi choba nwunye di ya okwu, o si ya nye ya mmanu ka o wee taa akwu
When a woman wants to make trouble for her co-wife she asks for palm oil to use to eat palm fruits

Anyi na-asikwa na
Achou onye n'ikwu nna, o naa n'ikwu nne ya
When someone is pursed from his father's house, he goes to his mother's house

Ndi be anyi ekelekwa mu unu,  Noronu juu
Re: Igbos come show your proverbs skills by Kashif(m): 12:06pm On Sep 10, 2007
echelon,

I na acho ikpa mu bu agu aka n'odu. Okwa i ma na agadi nwanyi adighi aka nka n'egwu o ma agba? Chere ka m nozie ka m we gosi gi na kama egbe ama efe chaa, ya fee ka udene. Ihe di woro ogori azuola n'ahia.

Udo diri umu ibe.
Re: Igbos come show your proverbs skills by faketan(m): 12:32pm On Sep 10, 2007
Nkita nyara akpa nsi agwu n'ohia. Ikwuikwui nyuru aru si umu nna ya kwere ya egwu. ha si ya tufuakwa, na anaghi ekwere ihe ojoo egwu. Ewu nwuru n'oba ji abughi aguu gburu ya. Onye si na igbo erijughi afo? O bu n'imaghi na achuo aja ma ahughi udele, a mara na ihe mere be ndi muo. Maazi Kashif, kedu ebe i no eri oge? I mana diochi a dighi ekwucha ihe ohuru na elu nkwu. Nwunye awo si na di atogbugo ya ya jiri luta nke ya kworo ya na azu.


I gatakwa I chete ulo,  nno diike.
Re: Igbos come show your proverbs skills by echelon(m): 12:39pm On Sep 10, 2007
@Kashif
Asi na mgbe onye ji teta ula obulu ututu ya, n'ihi nke a, nnoo

Ma mara amara na ogaranya bu omumue omume maka na adighi abu ogaranya abu.

Ndi be anyi si kwa na

Onye malu na odi ofele, ya puta ka o mee

Ekenekwa m gi,

*readers forgive me this is a personal msg*
Re: Igbos come show your proverbs skills by echelon(m): 11:47am On Sep 11, 2007
Ndị be anyị sị na achụkata onye, achụnye ya n`ụwa ọma
When an individual is pursed, after sometime, he is pursed into a world of good.

Ife kwụlụ, ife akwụdebe ya
When something stands, another stands beside it (normally used to talk about a man and his wife)

Anyụsịa nsị ma akapịrị ya ọnụ, ọ bụrụ otoro
After pooing if the feaces is not pointed, it becomes dysentery grin

*the word of elders are words of wisdom*
Re: Igbos come show your proverbs skills by HUMPHERY(m): 3:28pm On Sep 11, 2007
IGBO NASI , ERIRI OTUONYE HURU NA AHO AGWO![i][/i] cool
Re: Igbos come show your proverbs skills by HUMPHERY(m): 3:30pm On Sep 11, 2007
ECHI EBUKA[i][/i] cool!

1 Like

Re: Igbos come show your proverbs skills by echelon(m): 1:43am On Sep 12, 2007
Ndị be anyị sị na

Aka nri kwọọ aka ekpe, aka ekpe akwọọ aka nri
If the right hand washes the left, the left will as well wash the right hand

Anya mmanwụ adịghịzị ebe akpọpụrụ oghere
The masqurade`s eyes are nolonger where the holes are made for it this is used to talk of hard times

Ezi nwanyị dị ukọ
Good women are scarce

Okenekwa
Re: Igbos come show your proverbs skills by echelon(m): 1:18pm On Sep 13, 2007
@topic

Kama ntu ahia ga-anyụ m ahia, m wenegara ya onye ziri m
Instead of losing my market due to "buy requests" by those at home, I'll send the requests back to them

Mmiri ugo jiri kwọ aka ka ụgbana jiri wụ arụ
The water the eagle used to wash hands is the same that the cattle egret used to bath. used to say that you can not satisfy the world no matter how you try

Ajụ na-ewona mmanwụ n'isi
The carrying pad/cloth is sinking on the masqurades head*warning: meaning not exactly this. this is used to talk of hard times*

Daalụnụ
Re: Igbos come show your proverbs skills by presido1: 9:30pm On Sep 13, 2007
ndigbo si na nwanyi di ime si na ihe na eme ya ihere abughi na odi ime kama o bu ya gafee ndi mmadu amara ihe omere were di ime.

Igbo na asi kwa na egbe oku da na ala nwayi aria ya elu.(when the long palm tree fell that a woman can climb it.) but
why should we be translating ebe ndi igbo na ekwu si na onye aturu ilu kowara ya ego ejiri lu nne ya furu ohia.

Let me go and read my igbo text book(Ome Na Uko) will be back tomorrow.
Igbo ekene m onu ncha. ka chi fo nu.
Re: Igbos come show your proverbs skills by echelon(m): 10:27pm On Sep 13, 2007
presido1:

but why should we be translating ebe ndi igbo na ekwu si na onye aturu ilu kowara ya ego ejiri lu nne ya furu ohia.

Translate equals Kowara

Translate is just to render it in another language, literally, not to explain the meaning.
Re: Igbos come show your proverbs skills by echelon(m): 12:10pm On Sep 14, 2007
Unu a saala chi?

@topic

Naanị anụ ji eze ari enu osisi mara nke na-enu inu
It's only the animal that climbs the tree with its teeth that knows which one is bittersimilar to english proverb: he that wears the shoe knows where it pinches

Ana ekwu na okuku gbanyere aja, ọ chịrị okpa naabọ wụnye
Complaint is being made that the chicken put some sand in the dish, it then walked into the dish.

Nkịta dina n'uche ọ dị ka ọ nọ n'ụra
When the dog is lying down meditating, it appears as if it's sleeping

Ya gazie

1 Like

Re: Igbos come show your proverbs skills by faketan(m): 12:54pm On Sep 14, 2007
Asiri m unu na Ikwikwi nyuru aru si umu nna ya kwere ya egwu, ha asi ya mbakwa na adighi ekwere ihe ojoo egwu.
Okwa unu ma na o na abu ahu ihe ka ubi eree oba.
Unu amakwa na-agadi nwanyi a naghi aka nka n'egwu O mara agba? mgbe aka kpaara ezekudele. Okwuo Onye chiri ya ozo.

Unu makwa na-anaghi atu otu ukwu egwu maka n'obughi yanwa ga-ara onwe ya.

Ndeewonu.
Re: Igbos come show your proverbs skills by echelon(m): 3:59pm On Sep 14, 2007
@topic

Mmadụ anaghị agbalụ ife bia na be nna ya ọsọ
Nobody runs for something that comes into his father's compound

Ka ife esina sie ike, o nwelu ife sikarịrị ya n ike
However strong something is, there is always something stronger

Asị onye ara bia kere oke ihe nna ya nwuru anwu, ọ sị na nke o ji ka grin
When the mad man is asked to come and take his share of his late dad's property, he says that what he has is better

Okenekwaa
Re: Igbos come show your proverbs skills by osisi5: 5:30pm On Sep 14, 2007
daalu so echelon.

loved all your ilus
Re: Igbos come show your proverbs skills by echelon(m): 9:58pm On Sep 14, 2007
Ọ ife anyị na-emelụ onwe anyị  grin

glad you enjoy them

(1) (2) (3) ... (19) (20) (21) (22) (23) (24) (25) ... (101) (Reply)

African Weddings From All Over! / Keggites Members : Introduce Yourself & Ilya / Yoruba Idioms: Owe Yoruba, Itunmo Re Ati Lilo Re

Viewing this topic: 1 guest(s)

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 44
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.