Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,156,173 members, 7,829,194 topics. Date: Wednesday, 15 May 2024 at 09:21 PM

A Dọhapụla Ozu Nwatakịrị A Mụrụ Ọhụụ N'ifite. By Izunna Okafor - Culture - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / A Dọhapụla Ozu Nwatakịrị A Mụrụ Ọhụụ N'ifite. By Izunna Okafor (639 Views)

Anambra Etinyela Ọtụtụ Ego Na Mmepe Ime Ime Obodo - Nnacheta. By Izunna Okafor / Oke Ọñụ, Dịka Ndi Ebenatọ Họpụtara Ndị Ndu Ọhụụ. By Izunna Okafor / Ndị Arewa Ekwena Nkwa Ịkwado Obianọ Nke Ugboro Abụọ. By Izunna Okafor (2) (3) (4)

(1) (Reply)

A Dọhapụla Ozu Nwatakịrị A Mụrụ Ọhụụ N'ifite. By Izunna Okafor by IzunnaOkafor(m): 11:48am On May 05, 2018
Igbo News Written By Izunna Okafor

N'ihi na a sị na chi na-efo, ihe ọjọọ ana-abawanye; ụbọchị ụka gara aga bụ nnọọ ụwa bịa lelee n'Ifite Awka dị n'okpuru ọchịchị Awka Sawụtụ nke steeti Anambra, dịka a hụrụ ozu nwatakịrị a mụrụ ọhụụ ma kachie ya n'àkpà n'ụsọ ebe ide mmiri si aga, n'okporo ụzọ ahụ siri Ifite wee gaa Mahadum Nnamdị Azikiwe.
Ya bụ ozu nwata na akụkọ so ya bụ nnọọ nke na-awụ akpata oyi, dịka otu onye akaebe na-akọwa na a tọgbọrọ nwatakịrị ahụ mgbe ọ ka dị ndụ, mana ide mmiri gbàgburu ya ma buruzie ozu ya sụtọba ya isi n'ọwà mmiri dị n'akụkụ okporo ụzọ ahụ, ka ụwa wee lelee.
N'okwu o kwuru ka a na-agba ya ajụjụ ọnụ, otu nwoke na-ere ahịa na mpaghara ebe ahụ, bụ onye ekweghị ka a mara aha ya kọwara nke ahụ dịka ihe jọgburu udele na njọ ma sigbuokwa nkakwụ n'isi, ma katọọ ajọ akparamagwa na nzuzu ụfọdụ ụmụnwaanyị, bụ ndị ọ kwuru na egwu Chineke adịghị n'ime ha ma ọlị. O kwuru na ọ bụ naanị onye enweghị uche, onye arabanko ma ọ bụ nwata nwaanyị amaghị uru nwa bara pụrụ ime ụdị ihe ahụ.
Onye akaebe ọzọ kọwara onwe ya dịka Chii kwuru na ihe ahụ aghaghị ịbụ aka ọrụ nwata akwụkwọ, n'ihi na ọtụtụ n'ime ha pụrụ iji ka ha wee gbanahị ihere maka ime mkpuke ha tụtara, wee mee ihe mmadụ atụghị anya.
O kwuru na karịa igbu nwata ahụ, na nne ya gara akpọje ya n'ebe a na-elekọta ụmụaka enweghị nne na nna, n'ihi na ọ nweghị onye maara echi.
Ka ọ dị ugbu a, e bupula ozu nwata ahụ dịka ndị bi na mpaghara ahụ siri wee kpọọ oku, ka o wee ghara ịnọ ebe ahụ regwòó.

2 Likes 1 Share

Re: A Dọhapụla Ozu Nwatakịrị A Mụrụ Ọhụụ N'ifite. By Izunna Okafor by prettyblacky(f): 12:11pm On Jun 09, 2018
IzunnaOkafor:

N'eziya, udi akuko di otua akarisila, okachakwa Mkpuru ubochi olemole.
Ihe mgbagwoju anya m ugbua bu kedukwanu ihe Kpatara nne nwa ahu jiri kwere iburu ya ruo onwa itolu, nakwerecha ahuhu nakwa ahu ufu dina afo ime macherekwa oge omuchara ya

(1) (Reply)

Ibo Vs. Yoruba Jallof Rice / What Do Igbo Men Want In A Wife? / Yoruba E Ronu

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 16
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.