Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,155,914 members, 7,828,194 topics. Date: Wednesday, 15 May 2024 at 05:45 AM

Egwuregwu Ndị Uwe Ojii Nke Ahọ 2020 Asarala Ọkụ Na Steeti Anambra - Culture - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / Egwuregwu Ndị Uwe Ojii Nke Ahọ 2020 Asarala Ọkụ Na Steeti Anambra (287 Views)

Mme Nke Annang- Akut Owo Annang Akut Owo Uko! / A Kpọkuola Ndị Ntorobịa Ka Ha Were Ohere Ọma Dịịrị Ha Wee Kpọrọ Ihe / Ndị Arewa Ekwena Nkwa Ịkwado Obianọ Nke Ugboro Abụọ. By Izunna Okafor (2) (3) (4)

(1) (Reply)

Egwuregwu Ndị Uwe Ojii Nke Ahọ 2020 Asarala Ọkụ Na Steeti Anambra by IzunnaOkafor(m): 9:39pm On Mar 05, 2020
Izunna Okafor dere akụkọ a


Ka ọ dị taa, ndị uwe ojii sitere mpaghara ebe dị iche iche n'ala Nigeria na-pịrịchara ma na-azọwarị ya ugbua na steeti Anambra, dịka asọmpi egwuregwu ndị uwe ojii nke ahọ 2020 saragòrò ọkụ na mpaghara ebe dị iche iche n'ime steeti ahụ.

Asọmpi egwuregwu ahụ bụ nke a gbapere n'isi ngwụcha izuụka gara aga n'ogige Alex Ekwueme dị n'Awka, bụ isi obodo steeti Anambra, site n'aka onyeisi ala Nigeria, bụ Maaazị Muhammadụ Buharị.
Ọ bụ nke a na-eme kwa ahọ abụọ ọbụla, ma bụrụkwa nke nọ n'agba nke iri na abụọ ya ugbua, kemgbe o jiri malite.

N'okwu ya oge ọ na-agbape ya bụ asọmpi egwuregwu, onyeisi ala Buharị, nke ọ bụ Minista na-ahụ maka ihe gbasaara ọrụ uwe ojii, bụ Maazị Muhammad Maigari Dingyadi nọchitere anya ya na mmemme ahụ, kọwara na ebumnobi ya bụ asọmpi egwuregwu bụ ịkwalite mgbasike na ahụike nke ndị uwe ojii site n'egwuregwu, ya na isi n'ụzọ dị otu ahụ kwàlite ọrụ ha nakwa mmekọrịta na njikọaka ha na ọhaneze.

O kwuru na ya bụ asọmpi egwuregwu nke ahọ a bịara nnọọ n'oge kwesiri ekwesi, n'ilekwasị anya n'etu ọnọdụ nchekwa, mpụ na arụrụala siri debe imi na ọnụ ka ntọọ ugbua na mpaghara ebe dị iche iche n'ala Nigeria, bụkwazị nke chọrọ mgbasike ọgụgụ isi na n'ọkpụkpụ aka nke ndị ọrụ nchekwa, iji wee nwee ike ibuso ya bụ ajọ ọnọdụ agha.

N'akụkụ nke ya, aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ, onye ọ bụ steeti ya na-ele ọbịa na ya bụ asọmpi egwuregwu, mèrè ka a mara na nke ahụ bụ nke mbụ na mbụ asọmpi egwuregwu metụtara ala Nigeria niile na-ewere ọnọdụ n'ime steeti ahụ, ma bụrụkwa nke mbụ na mbụ ya bụ asọmpi egwuregwu ndị uwe ojii na-ewere ọnọdụ na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ala Nigeria.

Ka ọ na-ekele ndị uwe ojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ dị iche ịche na steeti ahụ maka ezi ọrụ ha ime ka Anambra bụrụ steeti kachara nwee ezi nchekwa n'ala Nigeria, Gọvanọ Obianọ kpọpụtasịrị ọtụtụ uru dị iche iche steeti ahụ na ụmụafọ ya ga-enweta site n'ile ọbịa n'asọmpi egwuregwu ahụ, ma mekwa ka a mara na ego karịrị otu ijeri Naịra na ụma ise (N1.5bn) ga-abata n'ime steeti ahụ site na ya bụ egwuregwu.

Na ntụnye nke ha n'otu n'otu, onyeisi ndị uwe ojii n'ala Nigeria, bụ Maazị Mọhammed Abụbakar Adamu, na Minista na-ahụ maka egwuregwu n'ala Nigeria, bụ Maazị Sunday Dare kpọpụtasịrị ihe dị iche iche asọmpi egwuregwu ndị uwe ojii webàtagòrò n'ọrụ uwe ojii, nakwa ọtụtụ ndị sitegoro na ya bụ asọmpi egwuregwu wee gbagoruo ịbụ ndị na-ewu èwù n'ogoogo mba ụwa, nke gụnyere Chiọma Ajụnwa, Julius Aghahowa, Sunday Bada, Samuel Peter na imirikiti ndị ọzọ.

Ha gosipụtakwazịrị ezi olileanya ha nwere na a ga-esitekwa na ya bụ asọmpi egwuregwu nke ahọ a wee nyochapụta ma chọpụtakwa ọtụtụ ndị ọzọ ga na-ewukwa èwù n'ogoogo mba ụwa n'ihe gbasaara egwuregwu n'oge adịghị anya.

Ndị ọzọ dị iche iche sonyere na mmemme ịgbape asọmpi egwuregwu ahụ gụnyèrè Gọvanọ Steeti Ebonyi, nke ọ bụ osote ya nọchitere anya ya, Gọvanọ steeti Enugu, nke ọ bụ odeakwụkwọ ukwu steeti ahụ nọchiri anya ya, okwupụta okwu ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti Anambra, bụ Maazị Uchenna Okafor, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ e ji okwu ha agba izu na steeti ahụ na mpụga ya.

Ka ọ dị taa, a nọrọla na ya bụ asọmpi pịa ọkpọ, gbaa mgba, zọọ egwu ekere, gbaa ọsọ, ma gwuo mmiri, tinyere ọtụtụ egwuregwu ndị ọzọ ka kwụ n'ahịrị, dịka o siri dị n'usoro mgbasò e ji egwù ya bụ egwu nakwa otu e siri kerisie ya site n'oge ruo n'oge, na site n'ụbọchị ruo n'ụbọchị, wee ruo mgbe ọ ga-abịa n'isi njedobe.

Ya bụ asọmpi egwuregwu a kpọrọ "Anambra 2020" bụ nke malitere n'abalị iri abụọ na itghete nke ọnwa Febụwarị ka a na-atụkwa anya na ọ ga-abịa n'isi njedobe n'abalị asaa nke ọnwa Maarchị ahọ a.

Isiokwu asọmpi egwuregwu ndị uwe ojii nke ahọ a bụ (ma a tụgharịa ya) "Ịkwalite Nchekwa Obodo Site n'Egwuregwu"

1 Like

(1) (Reply)

Top 10 Greatest Emperor Of Ancient Roman / Learn And Trade Forex With Available Signals Doing 30-40+ In Profits Daily.. / Watch: Ghost And Spirit In A Free For All Fight And Social Distance Out The Win

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 12
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.