Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,160,450 members, 7,843,383 topics. Date: Wednesday, 29 May 2024 at 01:03 AM

Ndị Ọcha Ga-asụrịrị Igbo Taa — Nwaafọ Anambra Bi Philippines - Culture - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / Ndị Ọcha Ga-asụrịrị Igbo Taa — Nwaafọ Anambra Bi Philippines (146 Views)

Taa Ka Gọvanọ Willie Obianọ Agbara Ahọ Iri Isii Na Atọ (63): / Taa Ka Gọvanọ Willie Obianọ Agbara Ahọ Iri Isii Na Atọ (63): / Ndị Arewa Ekwena Nkwa Ịkwado Obianọ Nke Ugboro Abụọ. By Izunna Okafor (2) (3) (4)

(1) (Reply) (Go Down)

Ndị Ọcha Ga-asụrịrị Igbo Taa — Nwaafọ Anambra Bi Philippines by IzunnaOkafor(m): 6:02pm On May 11
Izunna Okafor dere akụkọ a

Ihe onyonyo na-atọ ọchị ma dịkwa mma nkiri agbasaala n'usoro nzikọrịtaozi ọgbaraọhụrụ, na-egosi otu nwoke Igbo bi na mba Philippines ka ọ na-akụziri ụfọdụ ụmụaka obodo ahụ ka e si asụ asụsụ Igbo.

Nwaafọ Nigeria ahụ, bụkwa onye na-eti egwu, Maazị Daniel Okafor (nke e ji Dandy Best wee mara) bụ̀ onye Ụmụdiala dị n'Ezinifite, n’okpuru ọchịchị Nnewi South nke steeti Anambra, ma bụrụkwa onye a hụrụ n’okporoụzọ dị na mba Philippines ahụ dị na mpaghara Ndịda-Ọwụwa Anyanwụ Eshia, ka ọ na-akụziri ụmụaka nọ ebe ahụ ka e si asụ, agụ ma na-akpọpụ̀ta okwu na ahịrịokwu Igbo.

Ihe onyoonyoo ahụ pụtara na nsonso a gòsịkwàrà ya bụ nwa amadi ka o ji Igbo primer akwụkwọ mkpụrụedemede, okwu na ahịrịokwu Igbo, bụ nke o ji akụziri ha ka e si akpọ ma na-agụ okwu Igbo.

N'okwu ya tupu ọ malite, ọ kọwàrà na ndị Igbo gaa n'ụfọdụ mba ndị ọzọ, na a na-amanye ha imụ̀tà asụsụ mba ahụ, nke na bụrụ na ha amụtaghị ya, ị mara na agụụ ga-afịọ ha ọnụ n'obodo ahụ.

“Ya mere, taa, achọrọ m ịkụziri ndị Philippines ka e si asụ asụsụ m — asụsụ Igbo. Ha ga-asụ Igbo. Ndị ọcha ga-asụrịrị Igbo taa. Ndị Philippines ga-asụrịrị Igbo,” ka o kwuru, dịka ọ na-egosipụtakwa akwụkwọ mkpụrụedemede Igbo ahụ, iji gosi na ọ dị nkwadobe wee gaa.

Mazị Okafor gosikwara otu narị peso (ego Philippines), bụ nke o kwere nkwà inye dịka ihe nrite nye nwata ọbụla nwetara mkpọpụta maọbụ ngụpụ̀ta ahịrịokwu Igbo ọbụla nke ọma.

Kaosiladị, oge nkuzi na ọmụmụ asụsụ Igbo ahụ bụ nke tọrọ ọchị, dịka ụmụntakịrị Philippines na-ataghèri ọnụ n'ịkpọpụta ụfọdụ okwu Igbo na iji ha mee ahịrịokwu, dịka “Aka”, “E ji aka eri ihe”, “Ada na-agba ọsọ” , “Dinta ji egbe achụ anụ”, wdg.

1 Like

Re: Ndị Ọcha Ga-asụrịrị Igbo Taa — Nwaafọ Anambra Bi Philippines by muyico(m): 6:08pm On May 11
murasi?
Re: Ndị Ọcha Ga-asụrịrị Igbo Taa — Nwaafọ Anambra Bi Philippines by Vyzz: 7:29pm On May 11
cool
Re: Ndị Ọcha Ga-asụrịrị Igbo Taa — Nwaafọ Anambra Bi Philippines by Pussyisgud: 7:33pm On May 11
Ya asika ndi ocha puta, Philippine esorokwa puta?
Re: Ndị Ọcha Ga-asụrịrị Igbo Taa — Nwaafọ Anambra Bi Philippines by yarimo(m): 7:56pm On May 11
They should be at alert, before he teach them how to do drugs
Re: Ndị Ọcha Ga-asụrịrị Igbo Taa — Nwaafọ Anambra Bi Philippines by RedboneSmith(m): 2:37pm On May 13
Abeg, make una no dey call every non-black person 'ndi ocha'. If you are not of European descent, you are not onye ocha anything.

Inukwa calling Filipinos ndi ocha. grin grin grin grin

(1) (Reply)

World Designers Awards / Top Love Spells Caster ♥(+27723039124)♥ In Wales, SCOTLAND, Ireland, LUXEMBOURG / Nigeria Is A Country With A Rich Culture And History, And Its Souvenirs And Gift

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 9
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.